O we rue n'Aikọniọm, na ha abua bàkọrọ n'ulo-nzukọ nke ndi-Ju, we kwue okwu n'uzọ nke mere ka oké ìgwe madu, ma ndi-Ju ma ndi-Grik, kwere na Jisus. Ma ndi-Ju ndi nēkweyeghi kpaliri nkpuru-obi ndi mba ọzọ, me ka ha jọ njọ n'ebe umu-nna nime Kraist nọ. Ya mere ha nọgidere n'ebe ahu oge di anya, nēkwuwa okwu nime Onye-nwe-ayi, Onye nāb͕ara okwu amara-Ya àmà, ebe Ọ nēnye ka eme ihe-iriba-ama na ọlu-ebube di iche iche site n'aka-ha. Ma ọra obodo ahu kewara: ufọdu we nọ n'akuku ndi-Ju, ufọdu nọ kwa n'akuku ndi-ozi Jisus. Mb͕e ndi mba ọzọ na ndi-Ju kwa, ha na ndi-isi-ha, nukọtara ime ha ihe-ihere, na itu ha nkume, ha we mata, b͕alaga n'obodo nke Laikaọnia, bú Listra na Dabe, na ala di ha buruburu: n'ebe ahu ka ha nēzisa kwa ozi ọma.
Gụọ ỌLU NDI-OZI 14
Geere nke a ntị ỌLU NDI-OZI 14
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ỌLU NDI-OZI 14:1-7
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo