Mb͕e ha nāpu, ha we riọ ka agwa ha okwu ndia n'ubọchi-izu-ike soni. Ma mb͕e nzukọ ahu lasasiri, ọtutu madu n'etiti ndi-Ju, na n'etiti ndi nēso uzọ ndi-Ju ndi nātu egwu Chineke, soro Pọl na Banabas: ndi nāgwa ha okwu, nēme kwa ha ka ha kweye inọgide n'amara nke Chineke. Ma n'ubọchi-izu-ike soni ọ fọduru ihe ntà ka obodo ahu nile zukọ inu okwu Chineke. Ma mb͕e ndi-Ju huru ìgwè madu ahu, ha juputara n'ekworo, we nēkwugide ihe nile Pọl nēkwu, ha nēkwulu kwa ha. Pọl na Banabas we kwuwa okwu, si, Ọ di nkpà ka eburu uzọ gwa unu okwu Chineke. Ebe unu nēnupu ya n'aru-unu, nekpe kwa onwe-unu ndi nēkwesighi ndu ebighi-ebi, le, ayi gaje ichighari gwa ndi mba ọzọ okwu. n'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi nyeworo ayi iwu, si, Edebewom I ka I buru ìhè nke mba nile, Ka I we di inye nzọputa rue nsọtu uwa. Ma mb͕e ndi mba ọzọ nuru nka, ha ṅuria, nye kwa okwu Chineke otuto: ha we kwere na Jisus, ka ha ra, bú ndi edoro inata ndu ebighi-ebi. Ewe nēbu okwu Onye-nwe-ayi jezu ala ahu dum. Ma ndi-Ju kwaliri ndinyom nātu egwu Chineke, bú ndi anāsọpuru, na ndi-isi obodo ahu, ha we kpalie nsob͕u megide Pọl na Banabas, we chupu ha n'ókè-ala-ha. Ma ha rupuru ájá nke ukwu-ha megide ha, we bia rue Aikọniọm. Ndi nēso uzọ Jisus we juputa n'ọṅù na Mọ Nsọ.
Gụọ ỌLU NDI-OZI 13
Geere nke a ntị ỌLU NDI-OZI 13
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ỌLU NDI-OZI 13:42-52
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo