Pọl-hà we si na Pafọs nupu ub͕ọ, bia rue Paga di na Pamfilia: jọn we rapu ha, laghachi na Jerusalem. Ma ha onwe-ha sitere na Paga gabiga, bia rue Antiọk di na Pisidia; ha we ba nime ulo-nzukọ-ha n'ubọchi-izu-ike, we nọdu ala. Ma mb͕e agusiri akwukwọ iwu na ndi-amuma, ndi-isi ulo-nzukọ ahu zigara ha ozi, si, Umu-nne-ayi, ọ buru na unu nwere okwu nkasi-obi igwa ndi-ayi, kwuenu. Pọl we bilie, kpukpu kwa aka, si,
Ndikom nke Israel, na ndi nātu egwu Chineke, nurunu. Chineke nke ndi nka, bú Israel, rọputara nna-ayi-hà, we welie ndi Israel elu mb͕e ha nọ dika ọbìa n'ala Ijipt, O were kwa ogwe-aka di elu duputa ha nime ya. Oge ra ka ọgu arọ abua O we nānagide omume-ha n'ọhia. Mb͕e O wedasiri mba asa n'ala Kenean, O me ka ha keta ala-ha, ihe ra ka nnù arọ na ọgu arọ abua na iri: mb͕e ihe ndia gasiri O nye ha ndi-ikpé rue oge Samuel, bú onye-amuma. Emesia ha riọ ka enye ha eze: Chineke we nye ha Sọl nwa Kish, nwoke nke sitere n'ebo Benjamin, onye chiri eze ọgu arọ abua. Mb͕e O wepusiri ya, O welie Devid ibu eze-ha; onye Ọ b͕a-kwa-ra àmà, si, Achọtawom Devid nwa Jesi, nwoke nke di ka obim si achọ, onye gēme ihe nile M'nāchọ. Site na nkpuru nwoke a ka Chineke wetara Israel Onye-nzọputa, bú Jisus, dika nkwa-Ya si di; mb͕e Jọn buru uzọ kwusa baptism nke nechègari nye ndi Israel nile, mb͕e Ọ kābataghi. Ma mb͕e Jọn nāb͕azu ọsọ-ya, ọ si, Gini ka unu nēchè na abum? Mu onwem abughi Ya. Kama, le, otù Onye nābia n'azum, Onye m'nēkwesighi itọpu akpukpọ-ukwu nke ukwu-Ya.