Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌLU NDI-OZI 12:1-11

ỌLU NDI-OZI 12:1-11 IGBOB

Ma dika n'oge ahu Herod, bú eze, tukwasiri aka-ya n'aru madu ufọdu nime nzukọ Kraist ime ha ihe ọjọọ. O we were mma-agha b͕ue Jemes nwa-nne Jọn. Ma mb͕e ọ huru na ọ di ndi-Ju utọ, o we jidekwasi Pita. Ubọchi ahu bu ubọchi achicha ekoghi-eko. Mb͕e o jidesiri ya, ọ tubà ya n'ulo-nkpọrọ, we rara ya nye n'aka ndi-agha iri na isi iche ya anọ anọ; nēzube ikuputa ya nye ndi-Ju mb͕e ememe ngabiga gasiri. Ya mere edebere Pita n'ulo-nkpọrọ: ma nzukọ Kraist nēkpegidesi ekpere ike nye Chineke n'ihi ya. Ma mb͕e Herod gaje ikuputa ya, n'otù abali ahu Pita nāraru ura n'etiti ndi-agha abua, eji nkpọrọ abua ke ya ab͕u: ndi-nche ndi nọ n'iru ọnu-uzọ nēchebe ulo-nkpọrọ. Ma le, mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi guzoro ya nso, ìhè nwu-kwa-ra n'ime-ulo nke ulo-nkpọrọ: o we tie Pita aka n'akuku, kpote ya, si, Bilie ọsọsọ. Nkpọrọ-ya abua we dapu n'aka-ya abua. Mọ-ozi ahu we si ya, Ke ihe-ọkiké n'úkwù-gi, yiri kwa akpukpọ-ukwu sandal gi. O we me otú ahu. Ọ we si ya, B͕okwasi uwe uku gi n'aru-gi, sọkwam. O we pua, so ya; ma ọ mataghi na ọ bu ezie, bú ihe emere site n'aka mọ-ozi, kama ọ nēchè na ọ nāhu ọhù. Ma mb͕e ha gasiri ndi-nche mbu na ndi-nche nke-abua, ha biaruru ọnu-uzọ-ama ígwè ahu nke esi abà nime obodo; nke meghere onwe-ya nye ha: ha we pua, gabiga n'otù uzọ ntà; ngwa ngwa mọ-ozi ahu we pua n'ebe ọ nọ. Mb͕e Pita mara onwe-ya, ọ si, Ub͕u a ka m'matara n'ezie, na Onye-nwe-ayi ziputara mọ-ozi-Ya, weputam n'aka Herod, ya na ile-anya nile nke ndi-Ju.