Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌLU NDI-OZI 12

12
1Ma dika n'oge ahu Herod, bú eze, tukwasiri aka-ya n'aru madu ufọdu nime nzukọ Kraist ime ha ihe ọjọọ. 2O we were mma-agha b͕ue Jemes nwa-nne Jọn. 3Ma mb͕e ọ huru na ọ di ndi-Ju utọ, o we jidekwasi Pita. Ubọchi ahu bu ubọchi achicha ekoghi-eko. 4Mb͕e o jidesiri ya, ọ tubà ya n'ulo-nkpọrọ, we rara ya nye n'aka ndi-agha iri na isi iche ya anọ anọ; nēzube ikuputa ya nye ndi-Ju mb͕e ememe ngabiga gasiri. 5Ya mere edebere Pita n'ulo-nkpọrọ: ma nzukọ Kraist nēkpegidesi ekpere ike nye Chineke n'ihi ya. 6Ma mb͕e Herod gaje ikuputa ya, n'otù abali ahu Pita nāraru ura n'etiti ndi-agha abua, eji nkpọrọ abua ke ya ab͕u: ndi-nche ndi nọ n'iru ọnu-uzọ nēchebe ulo-nkpọrọ. 7Ma le, mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi guzoro ya nso, ìhè nwu-kwa-ra n'ime-ulo nke ulo-nkpọrọ: o we tie Pita aka n'akuku, kpote ya, si, Bilie ọsọsọ. Nkpọrọ-ya abua we dapu n'aka-ya abua. 8Mọ-ozi ahu we si ya, Ke ihe-ọkiké n'úkwù-gi, yiri kwa akpukpọ-ukwu sandal gi. O we me otú ahu. Ọ we si ya, B͕okwasi uwe uku gi n'aru-gi, sọkwam. 9O we pua, so ya; ma ọ mataghi na ọ bu ezie, bú ihe emere site n'aka mọ-ozi, kama ọ nēchè na ọ nāhu ọhù. 10Ma mb͕e ha gasiri ndi-nche mbu na ndi-nche nke-abua, ha biaruru ọnu-uzọ-ama ígwè ahu nke esi abà nime obodo; nke meghere onwe-ya nye ha: ha we pua, gabiga n'otù uzọ ntà; ngwa ngwa mọ-ozi ahu we pua n'ebe ọ nọ. 11Mb͕e Pita mara onwe-ya, ọ si, Ub͕u a ka m'matara n'ezie, na Onye-nwe-ayi ziputara mọ-ozi-Ya, weputam n'aka Herod, ya na ile-anya nile nke ndi-Ju. 12Mb͕e ọ ghọtasiri ihe ahu, ọ bia rue ulo Meri nne Jọn onye akpọ-kwa-ra Mark; ebe ọtutu madu zukọrọri nēkpe kwa ekpere. 13Ma mb͕e ọ kuru aka n'ọnu-uzọ nke ọnu-uzọ-ama, otù nwa-ab͕ọghọ, aha-ya bu Roda, biara iṅa nti. 14Ma mb͕e ọ matara olu Pita, o megheghi ọnu-uzọ-ama n'ihi ọṅù, ma ọ b͕abàra nime ulo, kọrọ ha na Pita guzoro n'iru ọnu-uzọ-ama. 15Ma ha siri ya, Anya adighi gi nma. Ma o nēkwusi ike na ọ bu otú a. Ha we si, Ọ bu mọ-ozi-ya. 16Ma Pita nākugide aka n'ọnu-uzọ: mb͕e ha meghesiri, ha hu ya, ibobo we nwua ha n'aru. 17Ma mb͕e o kpukpusiri ha aka ikpuchi ọnu-ha, ọ kọrọ ha otú Onye-nwe-ayi duputara ya-ri n'ulo-nkpọrọ. Ọ si, Kọrọ Jemes na umu-nna-ayi ihe ndia. O we pua, ga ebe di iche. 18Ma mb͕e chi bọrọ, ọ bughi nkpasu ntà putara n'etiti ndi-agha, ihe mere Pita. 19Mb͕e Herod chọsiri ya, ma ọ chọtaghi ya, ọ kpe ndi-nche-ya ikpé, nye iwu ka ewe dupu ha ib͕u ha. O we si na Judia ridata na Sisaria, we nọgide n'ebe ahu.
20Ma Herod nēbu agha nke-uku megide Taia na Saidon n'obi-ya: ha we were otù obi biakute ya; mb͕e ha mesiri Blastọs eyì-ha, nke bu onye nēle ime-ulo-ndina nke eze anya, ha we riọ ka udo di n'etiti ha, n'ihi na esi n'ala nke eze ahu azù ala-ha. 21N'ubọchi akara àkà Herod we yikwasi uwe nke eze, nọkwasi n'oche-ikpé, gwa ha okwu. 22Ọra madu we tie nkpu, si, Ọ bu olu chi, ọ bughi kwa olu nke madu. 23Ngwa ngwa mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi we tie ya ihe, n'ihi na ọ nyeghi Chineke otuto ahu: ikpuru we tab͕ue ya, o we kubìe ume.
24Ma okwu Chineke nāga n'iru, nāba kwa uba.
25Banabas na Sọl we si na Jerusalem laghachi, mb͕e ha jezuru ozi-ha, nēkuru Jọn nke akpọ-kwa-ra Mark ya na ha yikọ je.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ỌLU NDI-OZI 12: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye