Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌLU NDI-OZI 11

11
1Ma ndi-ozi na umu-nna nime Kraist ndi nọ na Judia dum nuru na ndi mba ọzọ nara-kwa-ri okwu Chineke nke-ọma. 2Mb͕e Pita rigotara Jerusalem, ndi sitere na ndi obibì-úgwù we kwugide ya okwu, 3si, I bakuru ndikom ndi anēbighi úgwù, so ha rie ihe. 4Ma Pita malitere, we kọrọ ha okwu ahu n'usoro, si, 5Mu onwem nọ n'obodo Jọpa nēkpere: m'we hu ọhù nime inyoghi, otù ihe ka ọ nārida, dika oké ákwà ọcha nke anēsi n'elu-igwe were nkuku anọ eweda n'ala; o we bia rue ọbuná n'ebe m'nọ: 6mb͕e m'legidere ya anya, m'we tugharia uche, hu anu ukwu anọ di n'uwa na anu-ọhia na ihe nākpu akpu na anu-ufe nke elu-igwe nile di iche iche. 7M'we nu kwa otù olu ka ọ nāsim, Pita, bilie; b͕ue, ri kwa. 8Ma asirim, M'gaghi-eri ma-ọli, Onye-nwe-ayi: n'ihi na ọ dighi mb͕e ọ bula ihe ọ bula nke ruru arú ma-ọbu nke nādighi ọcha bàra n'ọnum. 9Ma otù olu zara nke ub͕ò abua site n'elu-igwe, si, Ihe Chineke mere ka ha di ọcha, gi onwe-gi emela ha ihe ruru arú. 10Ewe me nka ub͕ò atọ: ewe dọlie ha nile ọzọ n'elu-igwe. 11Ma le, n'otù oge ahu ndikom atọ guzoro n'iru ulo nke ayi nọ nime ya, ebe esiri na Sisaria ziterem ha. 12Mọ Nsọ we gwam ka m'so ha, ghara ime onwem di iche. Umu-nna-ayi isi ndia we sokwam; ayi we ba n'ulo nwoke ahu: 13o we kọrọ ayi otú ọ hururi mọ-ozi ka o guzoro n'ulo-ya, nāsi kwa, Ziga na Jọpa, kpọta Saimon, onye anākpọ kwa Pita; 14onye gāgwa gi okwu ufọdu, nke agēji zọputa gi, gi onwe-gi na èzí-na-ulo-gi nile. 15Ma mb͕e m'malitere ikwu okwu, Mọ Nsọ dakwasiri ha, dika ọ dakwasi-kwa-ra ayi na mbu. 16M'we cheta okwu Onye-nwe-ayi, otú Ọ siri, N'ezie Jọn jiri miri me baptism; ma agēji Mọ Nsọ me unu onwe-unu baptism. 17Ya mere ọ buru na Chineke nyere ha onyinye ra ka nke O nye-kwa-ra ayi, mb͕e ayi kwere n'Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, Mù onwem bu onye ipu ib͕ochi Chineke? 18Ma mb͕e ha nuru ihe ndia, ha kpuchiri ọnu-ha, we nye Chineke otuto, si, Ya mere ọ bu kwa ndi mba ọzọ ka Chineke nyere nchèghari nke nēdubà na ndu.
19Ya mere ndi b͕asara site na nkpab͕u nke putara n'ihi Stifen jeruru Finisia, na Saiprọs, na Antiọk, ha adighi-agwa onye ọ bula okwu Chineke ma-ọbughi nání ndi-Ju. 20Ma ufọdu di n'etiti ha, ndikom nke Saiprọs na Sairini, ndi, mb͕e ha biaruru Antiọk, ha gwa kwa ndi-Grik okwu ahu, nēzisa ozi ọma nke Onye-nwe-ayi Jisus. 21Aka Onye-nwe-ayi we so ha: oké ìgwè ndi kwere we chigharikute Onye-nwe-ayi. 22Akukọ bayere ha we ba na nti nzukọ Kraist di na Jerusalem: ha we zipu Banabas ije rue Antiọk: 23onye, mb͕e ọ biaruru, mb͕e ọ hu-kwa-ra amara Chineke, ọ ṅuria; o we riọ ha nile, ka ha zube n'obi-ha inọgide n'ebe Onye-nwe-ayi nọ: 24n'ihi na ọ bu ezi nwoke, juputa kwa na Mọ Nsọ na okwukwe: ewe tukwasi oké ìgwè madu nye Onye-nwe-ayi. 25O we pua je Tasọs ichọ Sọl: 26mb͕e ọ chọtara ya, o we kuru ya bia Antiọk. O we rue, na ọbuná ogologo otù arọ ha zukọrọ na nzukọ Kraist, zí kwa oké ìgwè madu ihe; na ọ bu kwa n'Antiọk ka eburu uzọ kpọ ndi nēso uzọ Jisus ndi-Kristian.
27Ma na mb͕e ahu ndi-amuma ufọdu siri na Jerusalem ridata n'Antiọk. 28Ma otù onye nime ha, aha-ya bu Agabọs, biliri, we gosi site na Mọ Nsọ na oké unwu gaje ida n'elu-uwa dum madu bi: nke putara n'oge Klọdiọs. 29Ndi nēso uzọ Jisus, onye ọ bula ka ihe o nwere ra, we zube izigara umu-nna nime Kraist ndi bi na Judia ihe iyere ha aka: 30nke ha me-kwa-ra, nēzigara ndi-okenye site n'aka Banabas na Sọl.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ỌLU NDI-OZI 11: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye