Pita we saghe ọnu-ya, si, N'ezie anamaghọta na Chineke abughi onye nēle madu anya n'iru: kama nime mba ọ bula onye nātu egwu Ya, onye nālu kwa ọlu ezi omume, bu onye Ọ nānara nke-ọma. Okwu nke O zitere umu Israel, nēzisa ozi ọma nke udo site n'ọnu Jisus Kraist (Onye ahu bu Onye-nwe madu nile) akukọ ahu unu onwe-unu matara, nke putara ìhè na Judia dum, nāmalite site na Galili, mb͕e baptism nke Jọn kwusara gasiri; bú Jisus Nke si na Nazaret puta, otú Chineke were Mọ Nsọ na ike te Ya dika manu-otite: Onye jeghariri nālu ọlu ọma, nēme kwa ka aru di ha ike, bú ndi nile ekwensu mere ha dika onye-nwe-ha; n'ihi na Chineke soro Ya. Ayi onwe-ayi bu kwa ndi-àmà nke ihe nile O mere n'ala ndi-Ju, na nime Jerusalem; Onye ha b͕u-kwa-ra, nākwuba Ya n'elu osisi. Onye ahu ka Chineke mere ka O si n'ọnwu bilie n'ubọchi nke-atọ, O were kwa Ya nye ka egosi Ya n'ìhè. Ọ bughi ndi-Ju nile ka egosiri Ya, kama ọ bu ndi-àmà Chineke buru uzọ rọputa, bú ayi onwe-ayi, ndi soro Ya nēri nāṅu kwa mb͕e O siri na ndi nwuru anwu bilie. O we nye ayi iwu ka ayi kwusara ndi-Ju, ka ayi kwusi kwa ike na Onye a bu Onye Chineke kaworo ibu Onye-ikpé nke ndi di ndu na ndi nwuru anwu. Onye ahu ka ndi-amuma nile nāb͕ara àmà, na site n'aha-Ya onye ọ bula nke kwere na Ya gānata nb͕aghara nmehie.
Gụọ ỌLU NDI-OZI 10
Geere nke a ntị ỌLU NDI-OZI 10
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ỌLU NDI-OZI 10:34-43
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị