N'echi-ya ha ba nime Sisaria. Ma Kọniliọs nēle anya ha, ọ kpọkọ-kwa-rari ndi-ikwu-ya na ndi-eyì-ya ọ huru n'anya. Ma mb͕e o ruru na Pita batara, Kọniliọs zutere ya, da n'ala n'ukwu-ya, kpọ isi ala nye ya. Ma Pita weliri ya elu, si, Bilie; mu onwem bu kwa madu. Ka ya na ya nākparita uka, ọ ba nime, hu ọtutu madu ndi b͕akọrọri: o we si ha, Unu onwe-unu mara otú ọ bu ihe nēzighi ezi n'iwu ka nwoke nke bu onye-Ju were onwe-ya rapara n'aru onye mba ọzọ ma-ọbu ijekuru ya; otú ọ di, mu onwem ka Chineke gosiri ka m'ghara ikpọ madu ọ bula ihe ruru árú ma-ọbu ihe nādighi ọcha: n'ihi nka ka m'bia-kwa-ra nārugharighi uka, mb͕e eji kpọtam. Ya mere anamaju, Òkwu gini mere unu ji kpọtam? Kọniliọs we si, Ubọchi anọ gara aga, rue oge hour nka, m'nēkpe ekpere n'oge hour nke-iteghete n'ulom; ma le, otù nwoke guzoro n'irum n'uwe nēnwu enwu, si, Kọniliọs, anuru ekpere-gi, echeta-kwa-ra ọlu ebere gi nile n'iru Chineke. Ya mere ziga na Jọpa, kpọtara onwe-gi Saimon, onye anākpọ kwa Pita; onye ahu nānọ dika ọbìa n'ulo Saimon, bú onye nēdozi akpukpọ anu n'usọ oké osimiri. Ya mere n'otù oge ahu ka m'zigara gi; gi onwe-gi me-kwa-ra nke-ọma na i biawo. Ya mere ub͕u a ayi onwe-ayi nile nọ n'ebe a n'iru Chineke, inu ihe nile nke Onye-nwe-ayi nyeworo gi n'iwu.
Gụọ ỌLU NDI-OZI 10
Geere nke a ntị ỌLU NDI-OZI 10
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ỌLU NDI-OZI 10:24-33
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo