Ma otù nwoke nọ na Sisaria, aha-ya bu Kọniliọs, ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise nke òtù ndi-agha ahu anākpọ òtù Itali, onye nāsọpuru Chineke, onye ya na èzí-na-ulo-ya nile nātu kwa egwu Chineke, onye nālu ọtutu ọlu ebere nye ndi-Ju, nēkpe-kwa-ra Chineke ekpere mb͕e nile. Ọ huwara n'ọhù, n'ihe ra ka oge hour nke-iteghete n'ehihie, mọ-ozi nke Chineke, ka ọ nābiakute ya, nāsi kwa ya, Kọniliọs. O we legide ya anya, tu kwa egwu, si, Ọ̀ bu gini, Onye-nwe-ayi? Ọ si ya, Ekpere-gi nile na ọlu ebere gi nile rigoro ibu ihe-ncheta n'iru Chineke. Ub͕u a ziga kwa ndikom na Jọpa, kpọta otù onye, bú Saimon, onye anākpọ kwa Pita: onye ahu nānọ dika ọbìa n'ulo otù onye, bú Saimon, onye nēdozi akpukpọ anu, onye ulo-ya di n'usọ oké osimiri. Ma mb͕e mọ-ozi ahu nke gwara ya okwu lasiri, ọ kpọ madu abua nime ndi nējere ya ozi, na otù onye-agha nke nāsọpuru Chineke nime ndi nānọgide ya nso mb͕e nile; mb͕e ọ kọsiri ha ihe nile, o we ziga ha na Jọpa.
Gụọ ỌLU NDI-OZI 10
Geere nke a ntị ỌLU NDI-OZI 10
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ỌLU NDI-OZI 10:1-8
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo