Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. SAMUEL 3:22-39

II. SAMUEL 3:22-39 IGBOB

Ma, le, ndi-orù Devid na Joab si n'usu ndi nāpunara madu ihe bia, ọ bu kwa ọtutu ihe-nkwata ka ha bubatara n'aka ha: ma Abnea anọyeghi Devid nime Hebron; n'ihi na o zilagawo ya, o we la n'udo. Joab na usu-ndi-agha nile ndi soro ya we bia, ha we gosi Joab, si, Abnea nwa Nea biakutere eze, o we zilaga ya, o we la n'udo. Joab we biakute eze, si, Gini ka i meworo? le, Abnea biakutere gi; n'ìhi gini ka nka bu, na i zilagawo ya, o we lasia? I mawo Abnea nwa Nea, na ọ bu irafu gi ka ọ biara, ya na imara ọpupu-gi na nbata-gi, na imata ihe nile nke gi onwe-gi nēme. Joab we si n'ebe Devid nọ puta, ziga ndi-ozi n'azu Abnea, ha we me ka o si n'olùlù-miri Saira biaghachi: ma Devid amaghi. Abnea we laghachi rue Hebron, Joab we wezuga ya n'etiti ọnu-uzọ-ama ikpayere ya uka na nwayọ, o we tie ya n'okpuru ọgiriga-ya nke-ise n'ebe ahu, o we nwua n'ihi ọbara Asahel, bú nwa-nne-ya. Devid we nu nke a mgbe emesiri, ọ si, Ndi puworo n'ọbara Abnea nwa Nea n'iru Jehova rue mb͕e ebighi-ebi ka mu na ala-ezem bu: ka ọ dakwasi n'isi Joab, na n'ulo nna-ya nile; ka aghara kwa ibipu n'ulo Joab onye nwere orùrù n'anu-aru-ya, ma-ọbu onye-ekpenta, ma-ọbu onye nādabere na nkpa-n'aka, ma-ọbu onye nāda site na mma-agha, ma-ọbu onye nri kọrọ. Ma Joab na Abishai, bú nwa-nne-ya, b͕uru Abnea, n'ihi na o mere ka nwa-nne-ha, bú Asahel, nwua nime Gibeon n'agha ahu. Devid we si Joab, si kwa ndi nile ya na ha nọ, Dọwanu uwe-unu, ke ákwà-nkpe n'úkwù-unu, tie aka n'obi n'iru Abnea. Eze, bú Devid, nējeso kwa ihe eji ebu ozu. Ha we lìe Abnea nime Hebron: eze we welie olu-ya kwa ákwà n'ílì Abnea; ndi Israel nile we kwa ákwà. Eze we bùara Abnea abù-ákwà, si, Ọ̀ bu dika onye-nzuzu nānwu ka Abnea gānwu? Ekeghi aka-gi abua ab͕u, emeghi kwa ka ukwu-gi abua biarue nso ihe ọla eji ke ukwu ab͕u: Dika onye nāda n'iru ndi ajọ omume, otú a ka i dara. Ndi Israel nile we kwara ya ákwá ọzọ. Ndi ahu nile we bia ime ka Devid rie nri mb͕e ubọchi fọduru; ma Devid ṅuru iyi, si, Chineke mem otú a, me kwa ihe ọzọ otú a, ọ buru na edetum nri ọnu, ma-ọbu ihe ọ bula ọzọ, tutu ọdida-anyanwu. Ndi-ya nile we mata, ọ di nma n'anya-ha: dika ihe ọ bula eze mere di nma n'anya ndi-ya nile. Ndi-ya nile na Israel nile we mara n'ubọchi ahu na o siteghi n'aka eze ime ka Abnea nwa Nea nwua. Eze we si ndi-orù-ya, Únu amaghi na onye-isi na onye uku adawo n'Israel ta? Ma mu onwem akaghi aru ta, ọ bu ezie na abum onye etere manu ibu eze; ndikom ndia, bú umu Zeruaia, di kwa ike karim: Jehova kwughachi onye nēme ihe ọjọ dika ihe ọjọ ya si di.