Ndia bu aha ndi-dike, ndi Devid nwere; Josheb-bashebet onye-Tahkemonait, onye-isi nke ndi-ọchi-agha; onye ahu bu Adino onye-Eznait: onye nēmegide nnù ndikom abua eb͕uru n'otù ub͕ò. Nke so ya bu Eleeza nwa Dodai nwa onye Ahoa, bú otù onye n'etiti ndi-dike atọ ahu ndi ha na Devid nọ mb͕e ha rara onwe-ha nye rue ọnwu n'etiti ndi Filistia ndi chikọtara onwe-ha n'ebe ahu ibu agha, ma ndikom Israel rigoro: onye ahu biliri, tib͕u ndi Filistia rue mb͕e ike gwuru aka-ya, aka-ya we rapara na mma-agha: Jehova we zọputa nzọputa uku n'ubọchi ahu; ndi Israel we laghachi soro ya n'azu nání iyipu ihe di n'aru ndi eb͕uru eb͕u. Nke so ya bu Shama nwa Agi onye-Hararait. Ndi Filistia we chikọta onwe-ha n'usu, ma òkè ubi di n'ebe ahu juputara na lentil; ma ndi Israel b͕apuru n'iru ndi Filistia. O we guzo onwe-ya n'etiti òkè ahu, naputa ya, tib͕ue ndi Filistia: Jehova we zọputa nzọputa uku. Ndikom atọ n'etiti orú ndi-isi na iri ahu we rida, biakute Devid n'owuwe-ihe-ubi rue ọb͕à Adulam; ma usu ndi Filistia amawo ulo-ikwū-ha na ndagwurugwu Refaim. Ma Devid nọ n'ebe ahu ewusiri ike mb͕e ahu, ma ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia di na Bet-lehem mb͕e ahu. Devid we chọsie ike, si, Ònye gēme ka m'ṅua miri sitere n'olùlù-miri Bet-lehem, nke di n'ọnu-uzọ-ama: Ndi-dike atọ ahu we wapue ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia, sere miri n'olùlù-miri Bet-lehem, nke di n'ọnu-uzọ-ama, ha we būru ya, kutere Devid: ma o kweghi iṅu ya, o we wusiere ya Jehova. Ọ si, Ya burum ihe-árú, Jehova, ime ihe a: #m'gāṅu ọbara ndikom ahu ndi ji ndu-ha n'aka-ha nēje? o kweghi kwa iṅu ya. Ihe ndia ka ndi-dike atọ ahu mere.
Gụọ II. SAMUEL 23
Geere nke a ntị II. SAMUEL 23
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: II. SAMUEL 23:8-17
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị