Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. SAMUEL 2:1-11

II. SAMUEL 2:1-11 IGBOB

O rue, ka nka gasiri, na Devid juru Jehova ese, si, M'gārigo n'otù nime obodo Juda? Jehova we si ya, Rigo. Devid we si, Òle ebe M'gārigo? Ọ si, Rue Hebron. Devid we rigo n'ebe ahu, ya na ndinyom-ya abua kwa, bú Ahinoam nwayi Jezreel, na Abigail, bú nwunye Nebal onye Kamel. Ndikom ndi ya na ha nọ ka Devid me-kwa-ra ka ha rigota, nwoke ọ bula na ulo-ya: ha we biri n'obodo nile nke Hebron. Ndikom Juda we bia te Devid manu n'ebe ahu ibu eze ulo Juda. Ha we gosi Devid, si, Ndikom Jebesh-gilead bu ndi lìri Sọl. Devid we zigara ndikom Jebesh-gilead ndi-ozi, si, ha, Ndi agọziri agọzi diri Jehova ka unu bu, na unu emeworo onye-nwe-unu, bú Sọl, ebere a, unu we líe-ya. Ma ub͕u a Jehova mere unu ebere na ezi-okwu: ọzọ kwa, mu onwem gēmeghachiri unu ezi ihe a, n'ihi na unu emewo ihe a. Ma ub͕u a ka aka-unu di ike, buru-kwa-nu ndi-dinkpà: n'ihi na onye-nwe-unu, bú Sọl, anwuwo; ọzọ kwa, mu ka ulo Juda teworo manu ibu eze-ha. Ma Abnea nwa Nea, bú onye-isi usu-ndi-agha Sọl nwere, kuru Ish-boshet nwa Sọl, me ka ọ gabiga rue Mahanaim; o we me ya eze Gilead, na nke ndi-Ashurait, na nke Jezreel, na nke Efraim, na nke Benjamin, na nke Israel nile. (Ish-boshet nwa Sọl b͕ara ọgu arọ abua mb͕e ọ malitere ibu eze Israel, o we buru eze arọ abua.) Otù ọ di, ulo Juda soro Devid. Ọnu-ọgugu ubọchi Devid bu eze ulo Juda nime Hebron we di arọ asa na ọnwa isi.