Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. SAMUEL 16:5-13

II. SAMUEL 16:5-13 IGBOB

Eze, bú Devid, we biarute Bahurim, ma, le, otú nwoke nke sitere n'ab͕uru ulo Sọl nēsi n'ebe ahu puta, aha-ya bu Shimai, nwa Gira: ọ nāputa, nākọcha ka ọ nāputa. Ọ tua Devid nkume, tu kwa ndi-orù nile nke eze, bú Devid: ndi Israel nile na ndi-dike nile di kwa n'aka-nri-ya na n'aka-ekpe-ya. Ma otú a ka Shimai siri mb͕e ọ nākọcha, Pua, pua, gi nwoke ọbara na nwoke jọb͕uru onwe-ya: Jehova eweghachiwo n'isi-gi ọbara nile nke ulo Sọl, onye i buworo eze n'ọnọdu ya; Jehova enyewo kwa ala-eze n'aka Absalom, bú nwa-gi: ma, le, n'ihe ọjọ gi ka ejideworo gi, n'ihi na nwoke ọbara ka i bu. Abishai nwa Zeruaia we si eze, N'ìhi gini ka nkita nka nke nwuru anwu nākọcha onye-nwem, bú eze? biko, ka m'gabiga, wezuga isi-ya. Eze we si, Gini ka mu na unu nwekọrọ umu Zeruaia? mb͕e ọ nākọcha, mb͕e Jehova siwo-kwa-ra ya, Kọcha Devid; ònye gāsi kwa, Gini mere i meworo otú a? Devid we si Abishai, si kwa ndi-orù-ya nile, Le nwam, nke siri n'afọm puta, nāchọ ndum: onye Benjamin nka, ò gēsi kwa aṅa ghara ichọkari ya ub͕u a? ka ọ nọduru onwe-ya, ka ọ kọcha kwa; n'ihi na Jehova siworo ya, Kọcha. Eleghi anya Jehova gēlekwasi nwedam anya, Jehova gēnyeghachikwam ezi ihe n'ọnọnọdu nkọcha-ya ta. Devid na ndikom-ya we je n'uzọ ahu: Shimai nēje kwa n'akuku ugwu na ncherita-iru ya, ọ nēje ije we kọcha, tu kwa nkume na ncherita-iru ya, kpoli kwa ájá.