Absalom na ndi nile, bú ndikom Israel, we ba na Jerusalem, Ahitofel so-kwa-ra ya ba. O rue, mb͕e Hushai, bú onye-Akait, bú eyì Devid, biakutere Absalom, na Hushai siri Absalom, Ka eze di ndu, ka eze di ndu. Absalom we si Hushai, Ọ̀ bu nka bu ebere i nēmere eyi-gi? n'ìhi gini ka i nēsoghi eyì-gi je? Hushai we si Absalom, É-è, kama onye Jehova na ndi nka na ndikom nile nke Israel rọputaworo, ya ka m'gādiri, ọ bu kwa n'aka-ya ka m'gēbiri. Ọzọ kwa, ònye ka mu onwem gēfè òfùfè? Ọ̀ bughi n'iru nwa-ya? dika m'fèworo òfùfè n'iru nna-gi, otú a ka m'gābu n'iru gi. Absalom we si Ahitofel, Duanu ọdu n'onwe-unu ihe ayi gēme. Ahitofel we si Absalom, Bakuru ndi-iko nna-gi ndinyom, ndi o mere ka ha nọdu iche ulo; Israel nile gānu kwa na i nēsi nna-gi ísì ọjọ: aka ndi nile gi na ha nọ gādi kwa ike. Ha we b͕asara Absalom ulo-ikwū n'elu ulo; Absalom we bakuru ndi-iko nna-ya ndinyom n'anya Israel nile. Ọdu Ahitofel, nke ọ duru na mb͕e ahu, di ka agāsi na ajuru ase n'okwu Chineke: otú a ka idu-ọdu nile nke Ahitofel di, ma n'ebe Devid nọ ma n'ebe Absalom nọ.
Gụọ II. SAMUEL 16
Geere nke a ntị II. SAMUEL 16
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: II. SAMUEL 16:15-23
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị