Jehova we kwue site n'aka ndi-orù-Ya, bú ndi-amuma, si, N'ihi na Manase, bú eze Juda, emewo ihe-árú ndia, we me ihe ọjọ kari ihe nile nke ndi-Amorait mere, ndi buru ya uzọ, o we were arusi-ya nile me ka Juda mehie kwa: n'ihi ya otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Le, M'nēme ka ihe ọjọ biakwasi Jerusalem na Juda, nke nti abua nke onye ọ bula nānu gāzu wuruwuru. M'gēseti kwa n'elu Jerusalem eriri Sameria na ihe-ọtùtù ulo Ehab: M'gēhicha kwa Jerusalem dika madu si ehicha ọkwa, nēhicha ya, nēkpùta ya iru. M'gārapu kwa ndi fọduru nke ihe-nketam, nye ha n'aka ndi-iro-ha; ha gāghọ-kwa-ra ndi-iro-ha nile ihe-nluta-n'agha na ihe ha nānara n'ike; n'ihi na ha emewo ihe jọrọ njọ n'anyam, ha nākpasukwam ìwe, site n'ubọchi ndi bu nna-ha siri n'Ijipt puta, we rue ta. Ọzọ kwa, Manase wusiri ọbara nke-uku ri nne, bú nke nēmeghi ihe ọjọ, rue mb͕e o mejuru Jerusalem site n'otù ọnu-uzọ-ama rue ọnu-uzọ-ama ọzọ; nāgughi nmehie-ya nke o jiri me ka Juda mehie, ime ihe jọrọ njọ n'anya Jehova. Ma okwu Manase nile nke fọduru, na ihe nile o mere, na nmehie-ya nke o mehiere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda?
Gụọ II. NDI-EZE 21
Geere nke a ntị II. NDI-EZE 21
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: II. NDI-EZE 21:10-17
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo