Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. NDI-EZE 18:19-37

II. NDI-EZE 18:19-37 IGBOB

Rabshake we si ha, Biko, sinu Hezekaia, Otú a ka eze uku ahu siri, bú eze Asiria, Gini bu ntukwasi-obi a nke i ji tukwasi obi? I nāsi, (ma ọ bu nání okwu eb͕ub͕ere-ọnu) Ndum-ọdu na idi-ike di iji bu agha. Ub͕u a ònye ka i tukwasiworo obi, na i nupuwo isi n'okpurum? Ub͕u a, le, i tukwasiworo onwe-gi obi n'aru nkpa-n'aka amì a piara apia, bú n'aru Ijipt, nke nwoke nādabere na ya, o we ba n'ọbu-aka-ya, dua ya: otú a ka Fero, bú eze Ijipt, di n'ebe ndi nile nātukwasi ya obi nọ. Ma ọ buru na unu asim, Ọ bu Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi tukwasiworo obi: ọ̀ bughi Onye ahu bu onye Hezekaia wezugara ebe nile Ya di elu na ebe-ichu-àjà-ya nile, si Juda, si kwa Jerusalem, N'iru ebe-ichu-àjà nka ka unu gākpọ isi ala nime Jerusalem? Ma ub͕u a, biko, were onwe-gi mere onye-nwem, bú eze Asiria, ihe-ibe, ka m'nye kwa gi nnù inyinya ise, ọ buru na i puru inyere onwe-gi ndi gānọkwasi ha. Ì gēsi kwa aṅa chighari iru otù onye-ọchi-agha nke ndi-orù onye-nwem ndi kachasi ntà, tukwasiri onwe-gi obi n'aru Ijipt inwe ub͕ọ-ala na ndi-inyinya? Ub͕u a ọ̀ bu n'ejighi Jehova ka m'rigoro imegide ebe a ibibi ya? Jehovah sirim, Rigo imegide ala nka, bilie ya. Elaiakim nwa Hilkaia, na Shebna, na Joa, we si Rabshake, Biko, gwa ndi orù-gi okwu n'asusu Siria; n'ihi na ayi onwe-ayi nānu ya: akpaye-kwa-la ayi uka n'asusu ndi-Ju, na nti ndi nọ n'elu mb͕idi. Rabshake we si ha, Ọ̀ bu n'ihi onye-nwe-gi na ijekuru gi ka onye-nwem ziterem ikwu okwu ndia? ọ̀ bughi n'ihi ndikom ahu ndi nānọdu n'elu mb͕idi, ka ha we soro unu rie ǹsí-ha ṅu kwa nwa-miri-ha? Rabshake we guzo, were oké olu kpọ n'asusu ndi-Ju, kwue, si, Nurunu okwu eze uku ahu, bú eze Asiria. Otú a ka eze siri, Unu ekwela ka Hezekaia rafue unu; n'ihi na ọ pughi inaputa unu n'aka-ya: unu ekwe-kwa-la ka Hezekaia me ka unu tukwasi Jehova obi, si, Jehova aghaghi inaputa ayi, agaghi-enye kwa obodo a n'aka eze Asiria. Unu egela Hezekaia nti: n'ihi na otú a ka eze Asiria siri, Merenum ihe-ngọzi, pukutekwam; ri-kwa-nu, nwoke ọ bula nkpuru vine-ya, na nwoke ọ bula nkpuru osisi fig ya, ṅu-kwa-nu, nwoke ọ bula miri olùlù-miri-ya; rue mb͕e m'biara chiri unu je n'ala dika ala-unu, bú ala ọka na manya-vine ọhu, ala achicha na ubi-vine, ala manu olive na manu-aṅu, ka unu we di ndu, ghara inwu: unu ege-kwa-la Hezekaia nti, mb͕e ọ nārafu unu, si, Jehova gānaputa ayi. Chi nile nke mba nile ọzọ, hà anaputawo, onye ọ bula ala-ya, n'aka eze Asiria ma-ọli? Òle ebe chi nile nke Hemat na Apad di? òle ebe chi nile nke Sefavaim na Hina na Iva di? hà anaputawo Sameria n'akam? Òle ndi n'etiti chi nile nke ala dum ka ha bu, bú ndi naputara ala-ha n'akam, na Jehova gānaputa Jerusalem n'akam? Ma ndi-Ju b͕ara nkiti, ha azaghi kwa ya okwu: n'ihi na ihe eze nyere n'iwu bu nka, si, Unu azala ya. Elaiakim nwa Hilkaia, nke bu onye-isi ulo, na Shebna, bú ode-akwukwọ, na Joa nwa Esaf, bú onye-ncheta, we biakute Hezekaia, ha na uwe-ha dọwara adọwa, ha we gosi ya okwu nile nke Rabshake.