Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. NDI-EZE 15

15
1N'arọ nke-orú-na-asa nke Jeroboam, bú eze Israel, ka Azaraia nwa Amazaia, bú eze Juda, malitere ibu eze. 2Arọ iri na isi ka ọ b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; ọ buru eze ọgu arọ abua iri na abua nime Jerusalem: aha nne-ya bu Jekolaia nke Jerusalem. 3O me ihe ziri ezi n'anya Jehova, dika ihe nile si di nke Amazaia nna-ya mere. 4Nání na ewezugaghi ebe di elu: ndi Juda nọ nāchu àjà nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe di elu nile. 5Jehova we tie eze ahu ihe, o we buru onye-ekpenta rue ubọchi ọnwu-ya, we biri n'ulo ewupuru iche. Ma Jotam nwa eze bu onye-isi ulo-ya, nēkpe ndi ala ahu ikpe. 6Ma okwu Azaraia nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda? 7Azaraia we so nna-ya-ha dina n'ọnwu; ha we lìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Devid: Jotam nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.
8N'arọ nke-orú-na-iri-na-asatọ nke Azaraia, bú eze Juda, ka Zekaraia nwa Jeroboam malitere ibu eze Israel nime Sameria ọnwa isi. 9O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova dika nna-ya-hà mere: o sighi na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe-ya, bú nke o jiri me ka Israel mehie. 10Shalum nwa Jedesh we kekọta madu imegide ya, tib͕ue ya n'iru ndi Israel, me ka ọ nwua, we buru eze n'ọnọdu ya. 11Ma ihe Zekaraia mere nke fọduru, le, edewo ha n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel. 12Nka bu okwu Jehova, nke Ọ gwara Jihu, si, Umu-gi ndikom nke umu-umu nke-anọ gānọkwasiri gi n'oche-eze Israel. O we di otú a.
13Shalum nwa Jebesh malitere ibu eze n'arọ nke-orú-na-iri-na-iteghete nke Uzaia, bú eze Juda; o we buru eze ogologo otù ọnwa nime Sameria. 14Menahem nwa Gadi we si na Tiaza rigo, biarue Sameria, tib͕ue Shalum nwa Jebesh nime Sameria, me ka ọ nwua, we buru eze n'ọnọdu ya. 15Ma ihe nile Shalum mere nke fọduru, na nkekọta-ya nke ọ kekọtara madu imegide eze, le, edewo ha n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel. 16Mb͕e ahu Menahem tib͕uru Tifsa na ndi nile nọ nime ya, na ókè-ala-ya nile, site na Tiaza: n'ihi na ha emegheghi ya uzọ, n'ihi ya ka o tib͕uru ya; ndinyom-ya nile ndi di ime, ọ b͕awara ha afọ.
17N'arọ nke-orú-na-iri-na-iteghete nke Azaraia, bú eze Juda, ka Menahem nwa Gadi malitere ibu eze Israel arọ iri nime Sameria. 18O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova: o sighi na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe-ya ubọchi-ya nile, bú nmehie o jiri me ka Israel mehie. 19Pul, bú eze Asiria, we bia imegide ala ahu; Menahem we nye Pul nnù talent ọla-ọcha abua na ọgu iri, ka aka-ya we diyere ya ime ka ala-eze di ike n'aka-ya. 20Menahem we naputa ego ahu n'aka Israel, bú n'aka ndi-dike n'àkù, inye eze Asiria, ọgu shekel ọla-ọcha abua na iri diri otù nwoke. Eze Asiria we laghachi, o guzoghi kwa n'ebe ahu n'ala ahu. 21Ma okwu Menahem nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel? 22Menahem we so nna-ya-hà dina n'ọnwu; Pekahaia nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.
23N'arọ nke-ọgu-abua-na-iri nke Azaraia, bú eze Juda, ka Pekahaia nwa Menahem malitere ibu eze Israel nime Sameria arọ abua. 24O wee me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova; o sighi na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe-ya, bú nke o jiri me ka Israel mehie. 25Peka nwa Remalaia, bú onye-isi-agha-ya, we kekọta madu imegide ya, tib͕ue ya nime Sameria, n'ulo-elu nke ulo eze, ya na Agob na Arie; ọgu ndikom abua na iri nke umu ndi Gilead nọye-kwa-ra ya: o we me ka ọ nwua, we buru eze n'ọnọdu ya. 26Ma okwu Pekahaia nile nke fọduru, na ihe nile o mere, le, edewo ha n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel.
27N'arọ nke-ọgu-abua-na-iri-na-abua nke Azaraia, bú eze Juda, ka Peka nwa Remalaia malitere ibu eze Israel nime Sameria orú arọ. 28O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova: o sighi na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe-ya, bú nke o jiri me ka Israel mehie. 29N'ubọchi Peka, bú eze Israel, ka Tiglat-pilesa, bú eze Asiria, biara, were Ijon, na Ebel-bet-meaka, na Janoa, na Kedesh, na Hezoa, na Gilead, na Galili, bú ala nile nke Naftali; o we me ka ha je biri n'Asiria. 30Hoshea nwa Ila we kekọta nkekọta-madu megide Peka nwa Remalaia, tib͕ue ya, me ka ọ nwua, we buru eze n'ọnọdu ya, n'arọ nke-orú nke Jotam nwa Uzaia. 31Ma okwu Peka nile nke fọduru, na ihe nile o mere, le, edewo ha n'akwukwọ, ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel.
32N'arọ nke-abua nke Peka nwa Remalaia, bú eze Israel, ka Jotam nwa Uzaia, bú eze Juda, malitere ibu eze. 33Orú arọ na ise ka ọ b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ iri na isi nime Jerusalem: aha nne-ya bu Jerusha nwa-nwayi Zedok. 34O me ihe ziri ezi n'anya Jehova: dika ihe nile si di nke Uzaia nna-ya mere, otú a ka o mere. 35Nání na ewezugaghi ebe di elu: ndi Juda nọ nāchu àjà nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe di elu nile. Onye ahu wuru ọnu-uzọ-ama ulo Jehova nke di n'elu. 36Ma okwu Jotam nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda? 37Na mb͕e ahu ka Jehova malitere izite Rezin, bú eze Siria, na Peka nwa Remalaia, imegide Juda. 38Jotam we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà, n'obodo Devid nna-ya: Ehaz nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

II. NDI-EZE 15: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye