Amazaia nwa Joash, bú eze Juda, we di ndu mb͕e ọnwu Jehoash nwa Jehoahaz, bú eze Israel, gasiri, arọ iri na ise. Ma ihe nile nke Amazaia mere nke fọduru, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda? Ha we kekọta nkekọta-madu megide ya nime Jerusalem; o we b͕alaga na Lekish: ha we ziga ichuso ya rue Lekish, me ka ọ nwua n'ebe ahu. Ha we bute ya n'elu inyinya: ewe lìe ya nime Jerusalem n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Devid. Ndi nile nke Juda we were Azaraia, ma onye ahu b͕ara arọ iri na isi, ha we me ya eze n'ọnọdu nna-ya Amazaia. Ya onwe-ya wuru Ilat, nyeghachi ya Juda, mb͕e eze sorosiri nna-ya-hà dina n'ọnwu.
Gụọ II. NDI-EZE 14
Geere nke a ntị II. NDI-EZE 14
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: II. NDI-EZE 14:17-22
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo