Ma Elaisha nāria ọria nke ọria-ya ahu nke ọ nwuru nime ya: Joash, bú eze Israel, we ridakuru ya, kwa ákwá n'iru ya, si, Nnam, nnam, ub͕ọ-ala Israel, na ndi-inyinya-ya! Elaisha we si ya, Chiri uta na àkú: o we chiri uta na àkú n'aka-ya. Ọ si eze Israel, Tukwasi aka-gi n'uta: o we tukwasi aka-ya. Elaisha we tukwasi aka-ya abua n'aka abua nke eze. Ọ si, Meghe window n'akuku Iru-anyanwu: o we meghe. Elaisha we si, B͕a: o we b͕a. Ọ si, Àkú nzọputa Jehova nwere, bú àkú nzọputa imegide Siria: i gētib͕u kwa Siria n'Efek, rue mb͕e i gēme ka ha gwusia. Ọ si, Chiri àkú: o we chiri ha. Ọ si eze Israel, Tida n'ala: o we tie ub͕ò atọ, guzo. Onye nke Chineke ahu we wesa ya iwe, si, Asi na i tiri ub͕ò ise ma-ọbu ub͕ò isi; mb͕e ahu i gēti Siria rue mb͕e i gēme ka ọ gwusia: ma ub͕u a i gēti Siria nání ub͕ò atọ. Elaisha we nwua, ha we lìe ya. Ma usu ndi nāpunara madu ihe nke ndi Moab batara n'ala mb͕e arọ ọhu biara.
Gụọ II. NDI-EZE 13
Geere nke a ntị II. NDI-EZE 13
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: II. NDI-EZE 13:14-20
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị