Atalaia we nu olu ndi-ọb͕a-ọsọ na nke ndi Juda, o we biakute ndi ahu n'ulo Jehova: ọ hu, ma, le, eze nēguzo n'akuku ogidi, dika ikpé si di, ndi-isi na opì-ha di kwa n'akuku eze; ndi nile nke ala ahu ṅuri-kwa-ra ọṅu, fùa opì. Atalaia we dọwa uwe-ya nile, kpọ, si, Nkekọta imegide eze, nkekọta imegide eze. Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, we nye ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise iwu, bú ndi-nlekọta usu-ndi-agha, si ha, Menu ka ọ pua ba n'etiti akuku; ma onye nābiaso ya n'azu, werenu mma-agha me ka ọ nwua: n'ihi na onye-nchu-àjà siri, Ka aghara ime ka ọ nwua n'ulo Jehova. Ha we doro ya onwe-ha n'akuku abua; o we si uzọ nbata inyinya ba n'ulo eze: ewe me ka ọ nwua n'ebe ahu.
Gụọ II. NDI-EZE 11
Geere nke a ntị II. NDI-EZE 11
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: II. NDI-EZE 11:13-16
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo