Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. NDI KỌRINT 6:14-16

II. NDI KỌRINT 6:14-16 IGBOB

Unu na ndi nēkweghi ekwe ekekọtala onwe-unu, n'ihi na unu na ha di iche: n'ihi na òle nkekọ ezi omume na imebi-iwu nēkekọ? ma-ọbu òle nnwekọ ìhè na ọchichiri nēnwekọ? Ọzọ, òle nnwekọ-otù-olu Kraist na Belial nēnwekọ? ma-ọbu òle òkè onye kwere ekwe na onye nēkweghi ekwe nēkerita? Ọzọ, òle nkwekọ ulo nsọ nke Chineke na arusi nēkwekọ? n'ihi na ayi onwe-ayi bu ulo nsọ nke Chineke di ndu; dika Chineke kwuru, si, M'gēbi nime ha, nējeghari kwa nime ha; M'gābu kwa Chineke nke ha, ha onwe-ha gābu kwa ndi nkem.