Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. NDI KỌRINT 11:1-15

II. NDI KỌRINT 11:1-15 IGBOB

Ọ gādim nọ̄ nma ma ọ buru na unu gānagidem n'okwu ntà nke sitere n'enweghi-uche: ma unu nānagidem n'ezie. N'ihi na ejim ekworo Chineke nēkworo unu: n'ihi na ejikọrọm unu na otù di, ka m'we che unu n'iru Kraist dika nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú nke anēmerughi. Ma anamatu egwu, ma ọ nwere uzọ ọ bula agēmebi uche-unu ka unu pua n'afọ-ofufo na idi-ọcha nke di n'ebe Kraist nọ, dika agwọ ahu were aghughọ-ya ghọb͕ue Iv. N'ihi na asi na onye ahu nke nābia nēkwusa Jisus ọzọ, onye ayi nēkwusaghi, ma-ọbu asi na unu nānara mọ di iche, nke unu nānaraghi, ma-ọbu ozi ọma di iche, nke unu nānaraghi nke-ọma, unu nānagide ya nke-ọma. N'ihi na anamagu na ọ dighi uzọ ọ bula m'nērughi ndi kachasi elu n'etiti ndi-ozi. Ma asi na ọ bu ezie na abum onye nāmutaghi akwukwọ n'uzọ ikwu okwu, ma abughi m otú a n'uzọ ihe-ọmuma; kama ayi mere ka ọ puta ìhè nye unu n'ihe nile ọ bula n'etiti madu nile. Ma-ọbu ọ̀ bu nmehie ka m'mehiere, mb͕e m'wedara onwem n'ala ka ewe welie unu onwe-unu elu, n'ihi na ezirim unu ozi ọma nke Chineke n'onyinye-efu? Anapurum ihe n'aka nzukọ Kraist ọzọ, nānara ha ego-ọlu ka m'we jere unu ozi; mb͕e m'nọ-kwa-ra n'etiti unu, nọ kwa na nkpà, abughi m onye ọ bula ibu arọ́; n'ihi na umu-nna-ayi, mb͕e ha si na Masedọnia bia, ha mezuru ihe nke fọdurum inwe; edebe-kwa-ram onwem n'uzọ nile ọ bula ka m'ghara inyib͕u unu, otú a ka m'gēdebe kwa onwem. Dika ezi-okwu nke Kraist di nimem, agaghi-eb͕ochi inya-isi a nimem n'akuku nile nke Akaia. N'ìhi gini? ọ̀ bu n'ihi na ahughi m unu n'anya? Chineke matara. Ma ihe m'nēme ka m'gēme kwa, ka m'we bipuru ndi nāchọ ihe ha gēji megidem ihe ahu ha ji megidem; ha ewe hu na ha di kwa ka ayi onwe-ayi n'ihe ha nānya isi. N'ihi na madu di otú a bu ndi-ozi ugha, ndi-ọlu nātu ntu, ndi nēme onwe-ha ka ha yie ndi-ozi Kraist. Ọ bughi kwa ihe iju anya; n'ihi na Setan onwe-ya nēme onwe-ya ka o yie mọ-ozi nke ìhè. Ya mere ọ bughi ihe uku ma asi na ndi nējere ya ozi nēme kwa onwe-ha ka ha yie ndi nēje ozi ezi omume; ndi ọgwugwu-ha gādi ka ọlu-ha si di.