Pọl, onye-ozi nke Kraist Jisus site n'ọchichọ Chineke, na Timọti nwa-nna-ayi, nēdegara nzukọ Chineke nke di na Kọrint akwukwọ, ha na ndi nsọ nile ndi nọ n'Akaia dum: Amara diri unu na udo nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist puta. Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, bú Nna nke obi-ebere nile na Chineke nke nkasi-obi nile; Onye nākasi ayi obi na nkpab͕u-ayi nile, ka ayi we pu isite na nkasi-obi nke Chineke ji kasi ayi onwe-ayi obi kasie ndi ahu obi ndi nọ na nkpab͕u ọ bula. N'ihi na dika ahuhu nile Kraist huru nābabiga ókè n'ebe ayi nọ, otú a ka nkasi-obi-ayi nābabiga kwa ókè site n'aka Kraist. Ma ọ buru na anākpab͕u ayi, ọ bu n'ihi nkasi-obi-unu na nzọputa-unu; ọ buru kwa na anākasi ayi obi, ọ bu n'ihi nkasi-obi-unu, nke nālusi ọlu ike n'itachi obi n'otù ahuhu ahu nke ayi onwe-ayi nāhu kwa: olile-anya-ayi bayere unu nēguzosi kwa ike; ebe ayi matara na, dika unu bu ndi nēnwekọ ahuhu nile, otú a ka unu nēnwekọ kwa nkasi-obi ahu. N'ihi na, umu-nnam, ayi achọghi ka unu ghara imara ihe bayere nkpab͕u-ayi nke akpab͕uru ayi n'Esia, na esob͕uru ayi nke-uku ri nne, kari ike-ayi, ya mere ayi nwebigara obi abua ókè ma ayi gādi kwa ndu: e, ayi onwe-ayi enwewo ọziza azara nime onwe-ayi na ọ bu ọnwu, ka ayi we ghara itukwasi obi n'onwe-ayi, kama ọ bu na Chineke Onye nēme ka ndi nwuru anwu si n'ọnwu bilie: Onye dọputara ayi n'oké ọnwu di otú a, Ọ gādọputa kwa ayi: Onye ayi leworo anya Ya na Ọ ganādọputa kwa ayi ọzọ; ebe unu nēyekọ kwa aka n'ihi ayi n'aririọ-unu; ka ọtutu madu we kele ekele n'ihi ayi bayere onyinye-amara enyeworo ayi site n'aka ọtutu madu.
Gụọ II. NDI KỌRINT 1
Geere nke a ntị II. NDI KỌRINT 1
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: II. NDI KỌRINT 1:1-11
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo