Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. IHE EMERE 6:22-42

II. IHE EMERE 6:22-42 IGBOB

Ọ buru na nwoke emehie megide madu-ibe-ya, ewe tukwasi ya iyi ime ka ọ ṅua, iyi ahu we bia n'iru ebe-ichu-àjà-Gi n'ulo a: Gi onwe-gi si kwa n'elu-igwe nuru, me kwa, kpe ndi-orù-gi ikpe, inyeghachi onye ikpe mara, itukwasi uzọ-ya n'isi-ya; na igu onye ezi omume n'onye ezi omume, inye ya dika ezi omume-ya si di. Ọ buru kwa na etib͕ue ndi-Gi, bú Israel, n'iru onye-iro, n'ihi na ha nēmehie megide gi; ọ buru kwa na ha alaghachi, kwuputa aha-Gi, kpe ekpere, riọ amara n'iru Gi n'ulo a: Gi onwe-gi si kwa n'elu-igwe nuru, b͕aghara nmehie ndi-Gi, bú Israel, me ka ha lata n'ala nke I nyere ha, nye kwa ndi bu nna-ha. Mb͕e eb͕ochiri elu-igwe, mb͕e miri-ozuzo nādighi kwa, n'ihi na ha nēmehie megide Gi; ọ buru na ha ekpe ekpere n'ebe ebe a di, kwuputa aha-Gi, si na nmehie-ha laghachi, n'ihi na I nēweda ha n'ala: Gi onwe-gi nuru kwa n'elu-igwe, b͕aghara nmehie ndi-orù-Gi, na nke ndi-Gi, bú Israel, n'ihi na I nēzí ha ezi uzọ nke ha ganēje ije nime ya; Gi me kwa ka miri zokwasi ala-Gi, nke I nyeworo ndi-Gi ibu ihe-nketa. Mb͕e oké unwu gādi n'ala, mb͕e ajọ ọria nke nēfe efe gādi, mb͕e nchakpọ gādi, ma-ọbu ọmuma-ebu, ma-ọbu igurube, ma-ọbu ọbubu; mb͕e ndi-iro-ha gānọchigide ha n'agha n'ala nke ọnu-uzọ-ama nile ha; ihe-otiti ọ bula, ma-ọbu ọria ọ bula; ekpere ọ bula, aririọ-amara ọ bula, nke gādiri madu ọ bula, ma-ọbu nke gādiri ndi-Gi nile, bú Israel, ndi gāmara, nwoke ọ bula ihe-otiti-ya na ihe-nb͕u-ya, o we b͕asa ọbu-aka-ya abua n'ebe ulo a di: Gi onwe-gi si kwa n'elu-igwe, bú ọnọdu obibi-Gi guzosiri ike, nuru, b͕aghara, nye nwoke ọ bula dika uzọ-ya nile si di, onye I mara obi-ya; (n'ihi na Gi onwe-gi amawo obi umu madu, nání Gi;) ka ha we tua egwu Gi, ije ije n'uzọ-Gi nile, ubọchi nile nke ha onwe-ha nēbi n'elu ala ahu nke I nyere nna-ayi-hà. Ọzọ kwa, ihe bayere onye ala ọzọ, nke ọ bughi na ndi-Gi, bú Israel, ka o sitere, ma o siwo n'ala di anya bia n'ihi aha uku Gi, na aka-Gi di ike, na ogwe-aka-Gi esetiri eseti; mb͕e ha gābia kpe ekpere n'ebe ulo a di: Gi onwe-gi si kwa n'elu-igwe, site n'ọnọdu obibi-Gi guzosiri ike, nuru, me dika ihe nile si di nke onye ala ọzọ ahu nākpọku Gi; ka ndi nile nke uwa we mara aha-Gi, itu egwu Gi, dika ndi-Gi, bú Israel, si eme, na imara na akpọkwasiri aha-Gi n'ulo a nke M'wuworo. Mb͕e ndi-Gi gāpu ibuso ndi-iro-ha agha, n'uzọ ọ bula I gēziga ha, ha we kpere Gi n'uzọ obodo ahu nke I rọputaworo, na n'ebe ulo a di nke m'wuworo aha-Gi: Gi si kwa n'elu-igwe nuru ekpere-ha na aririọ-amara-ha, mezie ikpé-ha. Mb͕e ha gēmehie megide Gi, (n'ihi na ọ dighi madu ọ bula nke nādighi-emehie,) I we wesa ha iwe, rara ha nye n'iru onye-iro-ha, ndi nādọta ha n'agha ewe dọta ha n'agha je n'ala di anya ma-ọbu nke di nso; ha we chègharia n'obi-ha n'ala ebe adọtara ha n'agha, we chigharia, riọ Gi amara n'ala ndọta-n'agha-ha, si, Ayi emehiewo, me ajọ omume, mebie iwu-Gi; ọ buru kwa na ha ewere obi-ha nile, were kwa nkpuru-obi-ha nile, laghachikute Gi n'ala ndọta-n'agha-ha, bú ebe ha dọtara ha n'agha, we kpe ekpere n'uzọ ala-ha, nke I nyere ndi bu nna-ha, na obodo ahu nke I rọputaworo, na n'ebe ulo nke m'wuworo aha-Gi di: Gi si kwa n'elu-igwe, bú site n'ọnọdu obibi-Gi guzosiri ike, nuru ekpere-ha na aririọ-amara nile ha, mezie ikpé-ha; b͕aghara ndi-Gi ndi mehieworo megide Gi. Ub͕u a, Chinekem, biko, ka anya-Gi abua nāsaghe, ka nti-Gi abua nāṅa kwa nti, n'ekpere nke ebe a. Ma ub͕u a, bilie, Jehova, bú Chineke, ba n'ebe-izu-ike-Gi, Gi onwe-gi na ib͕e nke ike-Gi: Jehova, bú Chineke, ka ndi-nchu-àjà-Gi yiri nzọputa dika uwe, ka ndi-ebere-Gi ṅuri kwa ọṅu n'idi-nma. Jehova, bú Chineke, echigharila iru onye-Gi etere manu; cheta ebere nile nke Devid, bú orù-Gi.