Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. IHE EMERE 6:12-21

II. IHE EMERE 6:12-21 IGBOB

O we guzo n'iru ebe-ichu-àjà Jehova n'iru nkpọkọta nile nke Israel, we b͕asa ọbu-aka-ya abua: (n'ihi na Solomon mere ebe-nguzo di elu nke ọla-cubit ise ka ogologo-ya di, cubit ise ka obosara-ya di kwa, cubit atọ ka idi-elu, ya di kwa, o we tiye ya n'etiti ogige; o we guzo n'elu ya, b͕u ikperè-ya n'ala n'iru nkpọkọta nile nke Israel, b͕asa ọbu-aka-ya abua n'ebe elu-igwe di:) ọ si, Jehova, bú Chineke Israel, ọ dighi Chineke dika Gi, n'elu-igwe, ma-ọbu n'uwa; I nēdebere ndi-orù-Gi ọb͕ub͕a-ndu na ebere, bú ndi were obi-ha nile nējeghari n'iru Gi: I debeworo orù-Gi Devid, bú nnam, ihe I gwara ya: I we were ọnu-Gi kwue, were kwa aka-Gi mezue ya, otú ọ di ta. Ma ub͕u a, Jehova, bú Chineke Israel, debere orù-Gi Devid, bú nnam, okwu nke I gwaworo ya, si, Ọ dighi nwoke ọ bula i nwere agēbipu n'irum n'inọkwasi n'oche-eze Israel; nání ọ buru na umu-gi elezi uzọ-ha anya, ijeghari n'iwum dika i jeghariworo n'irum. Ma ub͕u a, Jehova, bú Chineke Israel, ka okwu-Gi kwesi ntukwasi-obi, nke I gwara orù-Gi, bú Devid. Ma ọ̀ bu ezie na Chineke gēbiyere madu n'elu uwa? le, elu-igwe na elu-igwe nke elu-igwe agaghi-anagide Gi; ulo a nke m'wuworo, ò gēsi kwa aṅa rue inagide Gi? Ma che iru n'ekpere orù-Gi, na n'aririọ-amara-ya, Jehova, bú Chinekem, ige nti iti-nkpu na ekpere orù-Gi nēkpe n'iru Gi: ka anya-Gi abua we nāsaghe n'ebe ulo a di ehihie na abali, bú n'ebe ebe ahu di nke I siworo na I gētiye aha-Gi n'ebe ahu; ige nti ekpere nke orù-Gi gēkpe n'ebe ebe a di. Ge kwa nti aririọ-amara nile nke orù-Gi, na nke ndi-Gi, bú Israel, mb͕e ha nēkpe ekpere n'ebe ebe a di: Gi onwe-gi si kwa n'ebe obibi-Gi, bú site n'elu-igwe, nuru; mb͕e I nuworo, Gi b͕aghara kwa.