Josaia b͕ara arọ asatọ mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze orú arọ na iri na otù nime Jerusalem. O me ihe ziri ezi n'anya Jehova, je ije n'uzọ nile nke Devid nna-ya, o wezugaghi kwa onwe-ya n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe. Ma n'arọ nke-asatọ nke ọ bu eze, mb͕e ya onwe-ya nọ na nwata, ọ malitere ichọ Chineke nke Devid nna-ya: n'arọ nke-iri-na-abua ka ọ malite-kwa-ra ime Juda na Jerusalem ka ha di ọcha pua n'ebe di elu nile, na Asherim, na arusi nile apiri api, na arusi nile awuru awu. Ha we kwatue ebe-ichu-àjà Bealim n'iru ya; o b͕utue arusi-anyanwu nile, nke di n'ebe di elu n'elu ugwu; o tipia-kwa-ra Asherim, na arusi nile apiri api, na arusi nile awuru awu, ọ supia ha, fesa n'elu ílì ndi nāchuru ha àjà. O sure ọkpukpu nke ndi-nchu-àjà n'elu ebe-ichu-àjà-ha, me ka Juda na Jerusalem di ọcha. O me-kwa-ra otú a n'obodo nile nke Manase na Efraim na Simeon, we rue Naftali, nime nkpọnkpọ-ebe-ha nile buruburu. Ọ kwatue ebe-ichu-àjà nile, tipia Asherim na arusi nile apiri api, ha we ghọ uzuzu, o b͕utu-kwa-ra arusi-anyanwu nile n'ala Israel nile, we lata na Jerusalem.
Gụọ II. IHE EMERE 34
Geere nke a ntị II. IHE EMERE 34
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: II. IHE EMERE 34:1-7
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo