Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. IHE EMERE 33:10-19

II. IHE EMERE 33:10-19 IGBOB

Jehova we gwa Manase okwu, gwa kwa ndi-ya: ma ha aṅaghi nti. Jehova we me ka ndi-isi usu-ndi-agha nke eze Asiria nwere biakwasi ha, ha we jide Manase n'ọhia-ogwu, were ihe ọla eji ke ukwu ab͕u ke ya ab͕u, me ka o jerue Babilon. Ma mbe anākpab͕u ya, ọ chọ ka iru Jehova, bú Chineke-ya, dajua, we ruru ala nke-uku n'iru Chineke nke nna-ya-hà. O we kpere Ya; O we kwe ka ọ riọta ihe ọ riọrọ, we nuru aririọ-amara-ya, me ka ọ lata na Jerusalem ba n'ala-eze-ya. Manase we mara na Jehova, Ya onwe-ya, bu Chineke. Mb͕e ihe ndia gasiri, o wuere obodo Devid mb͕idi n'azu mb͕idi-ya, n'akuku Ọdida-anyanwu nke Gaihon, nime ndagwurugwu, we rue nbata n'ọnu-uzọ-ama azù; ọ b͕a kwa Ofel buruburu, me ka ọ di elu nke-uku: o do-kwa-ra ndi-isi usu-ndi-agha n'obodo nile ewusiri ike nime Juda. O wezuga-kwa-ra chi nile nke ala ọzọ, si kwa n'ulo Jehova wezuga oyiyi-ihe ahu, ya na ebe-ichu-àjà nile nke o wuru n'ugwu ulo Jehova, na nime Jerusalem, o kpofue ha n'azu obodo. O wue ebe-ichu-àjà Jehova, chua n'elu ya àjà, bú àjà-udo na àjà-ekele, ọ si Juda ka ha fè Jehova, bú Chineke Israel, òfùfè. Otú ọ di, ndi Juda nọ nāchu àjà n'ebe di elu nile, ma ọ bu nání nye Jehova, bú Chineke-ha. Ma ihe nile Manase mere nke fọduru, na ekpere-ya o kpere Chineke-ya, na okwu nile nke ndi-ọhu-uzọ, bú ndi gwara ya okwu n'aha Jehova, bú Chineke Israel, le, edewo ha n'akwukwọ ihe ndi-eze Israel mere. Ekpere-ya kwa, na otú ekwere ka ọ riọta ìhe, na nmehie-ya nile, na nmekpu-ya, na ebe nile nke o wuru ebe di elu nime ha, guzo kwa Asherim na arusi apiri api, tutu o ruru ala: le, edewo ha n'akwukwọ okwu Hozai.