Jehoiada we me ọb͕ub͕a-ndu nke di n'etiti ya na ndi Juda nile na eze, na ha gābu ndi Jehova nwere. Ndi Juda nile we ba n'ulo Beal, kwatue ya, tupia ebe-ichu-àjà-ya nile na onyinyo-ya nile, ha b͕u-kwa-ra Matan, bú onye-nchu-àjà Beal, n'iru ebe-ichu-àjà ahu. Jehoiada we tiye nlekọta nile nke ulo Jehova n'aka ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, ndi Devid kère n'òkè ibu ndi-isi ulo Jehova, isure àjà-nsure-ọku nile nke Jehova, dika edeworo ya n'iwu Moses, n'ọṅù, na n'ibù-abù, site n'aka Devid. O we guzo ndi-ọnu-uzọ-ama n'ọnu-uzọ-ama nile nke ulo Jehova, ka onye ruru árú n'uzọ ọ bula we ghara ibà nime. O we chiri ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise, na ndi di ike nke-uku, na ndi nāchi achi n'etiti ndi Juda, na ndi nile nke ala ahu, me ka eze si n'ulo Jehova rida: ha we si n'etiti ọnu-uzọ-ama nke di n'elu ba n'ulo eze, me ka eze nọkwasi n'oche-eze nke ala-eze. Ndi nile nke ala ahu we ṅuria ọṅu, obodo ahu di-kwa-ra jū: ha we were mma-agha me ka Atalaia nwua.
Gụọ II. IHE EMERE 23
Geere nke a ntị II. IHE EMERE 23
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: II. IHE EMERE 23:16-21
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo