N'abali ahu ka Chineke mere ka Solomon hu ya anya, O we si ya, Riọ ihe M'gēnye gi. Solomon we si Chineke, Gi onwe-gi emeworo Devid nnam ebere uku, I we mem eze n'ọnọdu ya. Ub͕u a, Jehova, bú Chineke, ka okwu-Gi nke I gwara Devid nnam buru ihe kwesiri ntukwasi-obi: n'ihi na Gi onwe-gi emewom eze otù ndi nke bara uba dika ájá ala. Ub͕u a nyem amam-ihe na ihe-ọmuma, ka m'we nāpu apu nābata kwa abata n'iru ndi nka: n'ihi na ònye gēkpe ndi-Gi nka di uku ikpe? Chineke we si Solomon, N'ihi na nka di n'obi-gi, ma i riọghi àkù, ma-ọbu ihe-nkpakọta, ma-ọbu nsọpuru, ma-ọbu ndu ndi nākpọ gi asì, i riọghi kwa ọtutu ubọchi; kama i riọworo onwe-gi amam-ihe na ihe-ọmuma, ka i we kpe ndim ikpe, bú ndi M'meworo gi eze-ha: enyewo gi amam-ihe na ihe-ọmuma; M'gēnye kwa gi àkù, na ihe-nkpakọta, na nsọpuru, nke ndi-eze ndi buru gi uzọ nēnweghi otú a, ọ dighi kwa onye nke gēso gi gēnwe otú a. Solomon we si n'ije ọ jeruru ebe di elu nke di na Gibeon, si n'iru ulo-ikwū nzute, biarue Jerusalem; o we buru eze Israel.
Gụọ II. IHE EMERE 1
Geere nke a ntị II. IHE EMERE 1
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: II. IHE EMERE 1:7-13
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo