Ka ha ra, bú ndi-orù nke nọ n'okpuru yoke, ha gua ndi-nwe-ha na ndi kwesiri nsọpuru nile, ka ewe ghara ikwulu aha Chineke na ozizí-ayi. Ma ndi nwere ndi kwere ekwe dika ndi-nwe-ha, ka ha ghara ilelì ha anya, n'ihi na ha bu umu-nna-ha; kama ka ha buru orù-ha kari, n'ihi na ndi soro ha ke òkè n'ọlu ọma ha bu ndi kwere ekwe na ndi ahuru n'anya. Nēzí ihe ndia nādu kwa madu ọdú bayere ha.
Ọ buru na onye ọ bula nēzí ihe di iche, nēkweyeghi kwa n'okwu nēnye ezi ndu, bú okwu nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na ozizí ahu nke di ka nsọpuru-Chineke si di; afuliwo ya elu, ọ dighi ihe ọ mara, kama ọria bayere ajuju na esem-okwu n'ihi okwu efu nāria ya, nke ekworo, esem-okwu, nkwulu, ajọ èchìchè, nēsi nime ha nāputa, bú iru-uka nke madu ndi mebiworo n'uche, ndi apunarawo-kwa-ra ha ezi-okwu, ebe ha nāgu na nsọpuru-Chineke bu uzọ irita urù. Ma nsọpuru-Chineke, ya na inwezu ihe nile di nkpà, bu uzọ irita urù nke-uku; n'ihi na ayi ewetaghi ihe ọ bula n'uwa, ọ bu kwa n'ihi na ayi apughi iwere ihe ọ bula pua nime ya; ma ebe ayi nwere ihe-oriri na ihe ib͕okwasi n'aru, afọ gēju ayi n'ihe ndia. Ma ndi nēzube ibu ọgaranya nādabà n'ọnwunwa na ọnyà na ọtutu agu ihe ọjọ nke uche nādighi nime ha, nke nēmeru kwa aru, bú ihe nēme ka madu mikpù emikpù nime nbibi na ila-n'iyì. N'ihi na ihu ego n'anya bu nkpọrọgwu nke ihe ọjọ nile di iche iche: nke ufọdu nāb͕asosi ike, ewe duhie ha n'okwukwe-ayi, ha were kwa ọtutu ihe-nb͕u dupue onwe-ha.