Ya mere nke fọduru, umu-nna-ayi, ayi nēkpere unu, nāriọ kwa unu nime Onye-nwe-ayi Jisus, ka, dika unu natara n'aka-ayi otú unu nāghaghi ijeghari na ime ihe gātọ Chineke utọ, ọbuná dika unu nējeghari, ka unu nābabiga ókè nke-uku kari. N'ihi na unu matara iwu nile ayi nyere unu site n'aka Onye-nwe-ayi Jisus. N'ihi na nka bu ihe Chineke nāchọ, bú ka edo unu nsọ, ka unu ghara ikwa iko; ka onye ọ bula nime unu matara otú ọ gēnwe nwunye nke aka ya n'odido-nsọ na nsọpuru, ọ bughi n'ọchichọ ọjọ nke agu ihe ọjọ, ọbuná dika ndi mba ọzọ ndi nāmataghi Chineke; ka onye ọ bula ghara ighọb͕u na irib͕u nwa-nna-ya n'ihe a: n'ihi na Onye-nwe-ayi bu onye nābọ̀ ọ́bọ̀ bayere ihe ndia nile, dika ayi bu-kwa-ra uzọ gwa unu gwasi kwa unu ike. N'ihi na Chineke akpọghi ayi ka ayi buru ndi nādighi ọcha, kama n'odido-nsọ. Ya mere onye nāju, ọ bughi madu ka ọ nāju, kama ọ bu Chineke, Onye nēnye Mọ Nsọ Ya ka Ọ ba nime unu. Ma ọ dighi unu nkpà ka madu degara unu akwukwọ bayere ihunanya n'ebe umu-nna-unu nọ: n'ihi na unu onwe-unu bu ndi Chineke zíworo ihurita ibe-unu n'anya
Gụọ I. NDI TESALỌNAIKA 4
Geere nke a ntị I. NDI TESALỌNAIKA 4
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: I. NDI TESALỌNAIKA 4:1-9
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị