Kama ayi ghọrọ ndi di nwayọ n'etiti unu, dika mb͕e nwanyi nke nāzù nwa nēlezi umu nke aka ya anya nke-ọma: otú a, ebe unu di ayi n'obi nke-uku, ọ diri ayi ezi nma ime ka unu keta, ọ bughi nání ozi ọma nke Chineke, kama ọ bu kwa nkpuru-obi nke aka ayi, n'ihi na emere ka unu buru ndi ayi huru n'anya. N'ihi na unu nēcheta, umu-nna-ayi, ndọb͕u ayi nādọb͕u onwe-ayi n'ọlu na ihuju-anya-ayi: n'ihi na ayi nālu ọlu abali na ehihie, ka ayi we ghara ibob͕u onye ọ bula nime unu, ayi we kwusara unu ozi ọma nke Chineke. Unu onwe-unu bu ndi-àmà, Chineke bu kwa onye-àmà, otú ahuru ayi na ayi bu ndi di ọcha n'obi na ndi ezi omume na ndi nādighi ita uta n'ebe unu nọ, bú ndi kwere ekwe: ọbuná dika unu matara otú ayi mere madu nile ọ bula nime unu, dika nna si emere umu nke aka ya, nāriọ unu, nākasi kwa unu obi, nāgwasi kwa unu okwu ike, ka unu we nējeghari dika ọ kwesiri Chineke, Onye nākpọbata unu n'ala-eze na ebube nke aka Ya.
Gụọ I. NDI TESALỌNAIKA 2
Geere nke a ntị I. NDI TESALỌNAIKA 2
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: I. NDI TESALỌNAIKA 2:7-12
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị