Devid we si obi-ya. Ub͕u a agēkpochapum otù ubọchi site n'aka Sọl: ọ dighi ihe dirim nma kari iwepugasi onwem ba n'ala ndi Filistia; Sọl agaghi-atukwasi kwa obi-ya n'arum, ichọm ọzọ n'ókè-ala nile nke Israel: m'gēwepuga kwa onwem n'aka-ya. Devid we bilie, gabiga, ya onwe-ya na nnù ndikom na ọgu iri ndi nọ n'aka-ya, biakute Ekish nwa Maok, bú eze Gat. Devid we biri n'aka Ekish na Gat, ya onwe-ya na ndikom-ya, nwoke ọ bula na ulo-ya, bú Devid na ndinyom-ya abua, Ahinoam nwayi Jezreel, na Abigail nwayi Kamel, bú nwunye Nebal. Ewe gosi Sọl na Devid ab͕alagawo rue Gat: o we ghara ichọ ya ọzọ ma-ọli. Devid we si Ekish, Biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru-gi, ka ha nyem ebe n'otù obodo nime obodo ọhia, ka m'we biri n'ebe ahu: ma n'ìhi gini ka orù-gi gēbi n'obodo eze n'aka-gi? Ekish we nye ya Ziklag n'ubọchi ahu: n'ihi ya ndi-eze Juda nwe Ziklag rue ta. Ọnu-ọgugu ubọchi Devid biri n'ọhia ndi Filistia bu otù arọ zuru ezu na ọnwa anọ.
Gụọ I. SAMUEL 27
Geere nke a ntị I. SAMUEL 27
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: I. SAMUEL 27:1-7
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị