Devid we biarue Nob biakute Ahimelek, bú onye-nchu-àjà: Ahimelek we ma jijiji izute Devid, si ya Gini mere nání gi onwe-gi biara, ma ọ dighi nwoke gi na ya yikọrọ? Devid we si Ahimelek, bú onye-nchu-àjà, Eze enyewom ihe n'iwu, sim, Ka nwoke ọ bula ghara ima ihe ọ bula bayere ihe ahu nke mu onwem nēziga gi ozi-ya, na nke m'nyeworo gi n'iwu: emewokwam ka umu-okorọbiam mara na ha gēje n'ebe di otú a otú a. Ma ub͕u a gini di n'okpuru aka-gi? nyem ob͕e achicha ise n'aka, ma-ọbu ihe agāchọta. Onye-nchu-àjà ahu we za Devid, si, Ọ dighi achicha anēdoghi nsọ di n'okpuru akam, ma achicha nsọ di; nání ọ buru na umu-okorọbia ahu edebewo onwe-ha ghara imetu nwayi aru. Devid we za onye-nchu-àjà, si ya, N'ezie, ọ buru na eb͕ochiwo ndinyom n'imetu ayi aru, dika na mb͕e gara aga mb͕e m'nāputa, ihe umu-okorọbia we di nsọ, ma nke ahu bu ije nke anēdoghi nsọ; ìhe-ha gēsi kwa aṅa ghara idi nsọ kari ta? Onye-nchu-àjà we nye ya achicha nsọ: n'ihi na ọ dighi achicha di n'ebe ahu ma-ọbughi achicha nke iru Chineke, nke anēwezuga n'iru Jehova, idọba achicha di ọku n'elu table n'ubọchi ewepuru ya.
Gụọ I. SAMUEL 21
Geere nke a ntị I. SAMUEL 21
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: I. SAMUEL 21:1-6
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo