Jonatan we si ya, Echi ka ọnwa ọhu gāpu: agēle kwa anya gi, n'ihi na agēle anya ọnọdu-gi nke tọb͕ọrọ n'efu. Ma mb͕e i nọdusiri ubọchi atọ i garida ọsọsọ, ba n'ebe ahu, bú ebe izoro onwe-gi n'ubọchi ihe ahu emere, i gānọdu kwa n'akuku nkume Ezel. Mu onwem gāb͕a kwa àkú atọ n'akuku-ya, dika agāsi na ab͕aram ihe m'dotara. Ma, le, m'gēziga nwa-okorom, si, Je, chọta àkú nile. Ọ buru na asim nwa-okoro ahu ma-ọli, Le, àkú di n'akuku azu gi: chiri ha bia; n'ihi na udo diri gi, okwu adighi kwa, Jehova nādi ndu. Ma ọ buru na asim nwata-okorọbia ahu otú a, Le, àkú di n'akuku iru gi: la; n'ihi na Jehova ezilagawo gi. Ma okwu ahu nke mu na gi kwuworo, le, Jehova nọ n'etiti mu na gi rue mb͕e ebighi-ebi.
Devid we zo onwe-ya n'ọhia: ubọchi ọnwa ọhu we rue, eze we nọdu na nri iri ihe. Eze we nọkwasi n'ọnọdu-ya, dika ọ nēme ub͕ò ub͕ò, bú n'ọnọdu di n'akuku mb͕idi; Jonatan we bilie, Abnea we nọdu n'akuku Sọl: ma elere anya ọnọdu Devid nke tọb͕ọrọ n'efu. Ma Sọl ekwughi ihe ọ bula n'ubọchi ahu: n'ihi na ọ siri, Ihe-ndabà ka ọ bu; onye nādighi ọcha ka ọ bu; n'ezie ọ dighi ọcha. O rue n'echi nke ọnwa ọhu, nke bu ubọchi nke-abua, na elere anya ọnọdu Devid nke tọb͕ọrọ n'efu: Sọl we si Jonatan nwa-ya, Gini mere nwa Jesi abataghi iri nri ma nyahuru ma ta? Jonatan we za Sọl, si, Devid riọsirim ike ka m'rapu ya ka ọ je na Bet-lehem: ọ si, Biko, zilagam; n'ihi na àjà ab͕uru-ayi ka ayi nwere n'obodo; ya onwe-ya enyewom iwu, bú nwa-nnem, ije: ma ub͕u a, ọ buru na ahutawom amara n'iru gi, biko, ka m'wepuga onwem, we hu umu-nnem. N'ihi ya ọ biaghi na table eze. Iwe Sọl we di ọku megide Jonatan, ọ si ya, Gi nwa nke nwayi b͕agọrọ ab͕agọ nke nānupu kwa isi, àmaghm na gi onwe-gi nārọputa nwa Jesi ibu ihe-ihere-gi na ibu ihe-ihere ọtọ nne-gi? N'ihi na ubọchi nile nwa Jesi di ndu n'elu ala, agaghi-eme ka gi onwe-gi ma-ọbu ala-eze-gi guzosie ike. Ma ub͕u a ziga kutaram ya, n'ihi na onye kwesiri ọnwu ka ọ bu. Jonatan we za Sọl nna-ya, si ya, N'ìhi gini ka agēme ka ọ nwua? Gini ka o meworo? Sọl we tua ya ube-ya itub͕u ya: Jonatan we mara na nna-ya zubesiri ihe ahu ike, bú ime ka Devid nwua. Jonatan we si na table bilie n'iwe di ọku, o righi kwa nri n'ubọchi nke-abua nke ọnwa ahu: n'ihi na o wutara ya n'ihi Devid, n'ihi na nna-ya mere ya ihe-ihere.
O rue, n'ututu, na Jonatan puru je n'ọhia na mb͕e ya na Devid kara àkà, otù nwatakiri-nwoke so kwa ya. Ọ si nwa-okoro-ya, B͕a ọsọ, biko chọta àkú nile nke mu onwem nāb͕a. Mb͕e nwa-okoro ahu nāb͕a ọsọ, ya onwe-ya we b͕a àkú, me ka ọ gabiga ya. Nwa-okoro ahu we biarue ebe àkú ahu di, bú nke Jonatan b͕ara, Jonatan we kpọ òkù n'azu nwa-okoro ahu, si, Àkú ahu, ọ̀ dighi n'akuku iru gi? Jonatan we kpọ òkù n'azu nwa-okoro ahu, si, Me ngwa, je ọsọsọ, eguzola. Nwa-okoro Jonatan we chikọta àkú, biakute onye-nwe-ya. Ma nwa-okoro ahu amaghi ihe ọ bula: nání Jonatan na Devid mara okwu ahu. Jonatan we nye nwa-okoro o nwere ihe-ya, si ya, La, chiri ha ba n'obodo. Mb͕e nwa-okoro ahu basiri n'obodo, Devid we si n'akuku Negeb bilie, da kpue iru-ya n'ala, kpọ isi ala ub͕ò atọ: ha we suturita onwe-ha ọnu, kwaritara onwe-ha ákwá, rue mb͕e Devid kwakariri ákwá. Jonatan we si Devid, La n'udo, n'ihi na ayi aṅuwo iyi, ayi abua, n'aha Jehova, si, Jehova gānọ n'etiti mu na gi, na n'etiti nkpurum na nkpuru-gi, rue mb͕e ebighi-ebi. O we bilie, la: Jonatan we ba n'obodo.