Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. SAMUEL 20

20
1Devid we si na Naiot nime Rema b͕alaga, ọ bia kwue n'iru Jonatan, si, Gini ka m'meworo? gini bu ajọ omumem? gini bu kwa nmehiem n'iru nna-gi, na ọ nāchọ ndum? 2Ọ si ya, Ya buru ihe-árú; i gaghi-anwu: le, nnam adighi-eme ihe uku ma-ọbu ihe ntà, ma ọ buru na o kpughepughi ntim ka m'nu ya: gini me-kwa-ra nnam ji zonarim ihe a? ọ bughi otú a. 3Devid we ṅua iyi ọzọ, si, Nna-gi amawo nke-ọma na ahutawom amara n'iru gi; o we si, Ka Jonatan ghara ima nka, ka o we ghara iwuta ya: ma otú ọ di, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, nání ihe ra ka otù nzọ-ukwu di n'ab͕ata mu na ọnwu. 4Jonatan we si Devid, Gini ka nkpuru-obi-gi nāsi? m'gēme-kwa-ra gi ya. 5Devid we si Jonatan, Le, ọnwa ọhu gāpu echi, mu onwem aghaghi kwa iso eze nọdu n'iri ihe: ma zilagam, ka m'we zo onwem n'ọhia rue anyasi nwa-nne-echi. 6Ọ buru na nna-gi ele anyam ma-ọli, i gāsi kwa, Devid riọsirim ike ka m'rapu ya ka ọ b͕a ọsọ je Bet-lehem, bú obodo-ya: n'ihi na àjà arọ diri ab͕uru-ya nile n'ebe ahu. 7Ọ buru na ọ si otú a, Ọ di nma; udo gādiri orù-gi: ma ọ buru na iwe-ya di ọku nke-uku, mara na o zubesiri ihe ọjọ a ike. 8Ma i gēmere orù-gi ebere; n'ihi na i mere ka orù-gi soro gi ba n'ọb͕ub͕a-ndu Jehova: ma ọ buru na ajọ omume di nimem, gi onwe-gi me ka m'nwua; ma n'ìhi gini kwa ka i gēme ka m'bakuru nna-gi? 9Jonatan we si, Ya buru gi ihe-árú: n'ihi na ọ buru na amaram n'ezie na nnam zubesiri ike ka ihe ọjọ a biakwasi gi, #m'gaghi-egosi kwa gi ya? 10Devid we si Jonatan, Ònye gēgosim? ma-ọbu gini gēme ma ọ buru na nna-gi aza gi okwu ike? 11Jonatan we si Devid, Bia, ka ayi pua je n'ọhia. Ha abua we pua je n'ọhia. 12Jonatan we si Devid, Jehova, bú Chineke Israel, Ya buru onye-àmà; mb͕e m'gēnyochata obi nnam dika mb͕e a echi, ma-ọbu nwa-nne-echi, ma, le, ọ di nma n'ebe Devid nọ, #m'gaghi-ezite-kwa-ra gi ozi, we kpughepu nti-gi ka i nu ya? 13Jehova me Jonatan otú a, me kwa ya ihe ọzọ otú a, mb͕e ọ di nnam nma ime gi ihe ọjọ a, ma m'kpughepughi nti-gi ka i nu ya, we zilaga gi, ka i we la n'udo: Jehova nọye-kwa-ra gi, dika Ọ nọyeworo nnam. 14Ma ọ bughi nání mb͕e m'nọ na ndu ka i gēmerem ebere nke Jehova, ka m'we ghara inwu: 15kama i gaghi-ebipu kwa ebere-gi n'ulom rue mb͕e ebighi-ebi: i gaghi-ebipu kwa ya mb͕e Jehova bipuworo ndi-iro Devid, nwoke ọ bula n'elu uwa. 16Jonatan na ulo Devid we b͕a ndu, si, Jehova gājuta ya n'aka ndi-iro Devid. 17Jonatan we me kwa ka Devid ṅua iyi ọzọ, n'ihi na ọ huru ya n'anya: n'ihi na dika ọ huru nkpuru-obi nke onwe-ya n'anya, otú a ka ọ huru Devid n'anya. 18Jonatan we si ya, Echi ka ọnwa ọhu gāpu: agēle kwa anya gi, n'ihi na agēle anya ọnọdu-gi nke tọb͕ọrọ n'efu. 19Ma mb͕e i nọdusiri ubọchi atọ i garida ọsọsọ, ba n'ebe ahu, bú ebe izoro onwe-gi n'ubọchi ihe ahu emere, i gānọdu kwa n'akuku nkume Ezel. 20Mu onwem gāb͕a kwa àkú atọ n'akuku-ya, dika agāsi na ab͕aram ihe m'dotara. 21Ma, le, m'gēziga nwa-okorom, si, Je, chọta àkú nile. Ọ buru na asim nwa-okoro ahu ma-ọli, Le, àkú di n'akuku azu gi: chiri ha bia; n'ihi na udo diri gi, okwu adighi kwa, Jehova nādi ndu. 22Ma ọ buru na asim nwata-okorọbia ahu otú a, Le, àkú di n'akuku iru gi: la; n'ihi na Jehova ezilagawo gi. 23Ma okwu ahu nke mu na gi kwuworo, le, Jehova nọ n'etiti mu na gi rue mb͕e ebighi-ebi.
24Devid we zo onwe-ya n'ọhia: ubọchi ọnwa ọhu we rue, eze we nọdu na nri iri ihe. 25Eze we nọkwasi n'ọnọdu-ya, dika ọ nēme ub͕ò ub͕ò, bú n'ọnọdu di n'akuku mb͕idi; Jonatan we bilie, Abnea we nọdu n'akuku Sọl: ma elere anya ọnọdu Devid nke tọb͕ọrọ n'efu. 26Ma Sọl ekwughi ihe ọ bula n'ubọchi ahu: n'ihi na ọ siri, Ihe-ndabà ka ọ bu; onye nādighi ọcha ka ọ bu; n'ezie ọ dighi ọcha. 27O rue n'echi nke ọnwa ọhu, nke bu ubọchi nke-abua, na elere anya ọnọdu Devid nke tọb͕ọrọ n'efu: Sọl we si Jonatan nwa-ya, Gini mere nwa Jesi abataghi iri nri ma nyahuru ma ta? 28Jonatan we za Sọl, si, Devid riọsirim ike ka m'rapu ya ka ọ je na Bet-lehem: 29ọ si, Biko, zilagam; n'ihi na àjà ab͕uru-ayi ka ayi nwere n'obodo; ya onwe-ya enyewom iwu, bú nwa-nnem, ije: ma ub͕u a, ọ buru na ahutawom amara n'iru gi, biko, ka m'wepuga onwem, we hu umu-nnem. N'ihi ya ọ biaghi na table eze. 30Iwe Sọl we di ọku megide Jonatan, ọ si ya, Gi nwa nke nwayi b͕agọrọ ab͕agọ nke nānupu kwa isi, àmaghm na gi onwe-gi nārọputa nwa Jesi ibu ihe-ihere-gi na ibu ihe-ihere ọtọ nne-gi? 31N'ihi na ubọchi nile nwa Jesi di ndu n'elu ala, agaghi-eme ka gi onwe-gi ma-ọbu ala-eze-gi guzosie ike. Ma ub͕u a ziga kutaram ya, n'ihi na onye kwesiri ọnwu ka ọ bu. 32Jonatan we za Sọl nna-ya, si ya, N'ìhi gini ka agēme ka ọ nwua? Gini ka o meworo? 33Sọl we tua ya ube-ya itub͕u ya: Jonatan we mara na nna-ya zubesiri ihe ahu ike, bú ime ka Devid nwua. 34Jonatan we si na table bilie n'iwe di ọku, o righi kwa nri n'ubọchi nke-abua nke ọnwa ahu: n'ihi na o wutara ya n'ihi Devid, n'ihi na nna-ya mere ya ihe-ihere.
35O rue, n'ututu, na Jonatan puru je n'ọhia na mb͕e ya na Devid kara àkà, otù nwatakiri-nwoke so kwa ya. 36Ọ si nwa-okoro-ya, B͕a ọsọ, biko chọta àkú nile nke mu onwem nāb͕a. Mb͕e nwa-okoro ahu nāb͕a ọsọ, ya onwe-ya we b͕a àkú, me ka ọ gabiga ya. 37Nwa-okoro ahu we biarue ebe àkú ahu di, bú nke Jonatan b͕ara, Jonatan we kpọ òkù n'azu nwa-okoro ahu, si, Àkú ahu, ọ̀ dighi n'akuku iru gi? 38Jonatan we kpọ òkù n'azu nwa-okoro ahu, si, Me ngwa, je ọsọsọ, eguzola. Nwa-okoro Jonatan we chikọta àkú, biakute onye-nwe-ya. 39Ma nwa-okoro ahu amaghi ihe ọ bula: nání Jonatan na Devid mara okwu ahu. 40Jonatan we nye nwa-okoro o nwere ihe-ya, si ya, La, chiri ha ba n'obodo. 41Mb͕e nwa-okoro ahu basiri n'obodo, Devid we si n'akuku Negeb bilie, da kpue iru-ya n'ala, kpọ isi ala ub͕ò atọ: ha we suturita onwe-ha ọnu, kwaritara onwe-ha ákwá, rue mb͕e Devid kwakariri ákwá. 42Jonatan we si Devid, La n'udo, n'ihi na ayi aṅuwo iyi, ayi abua, n'aha Jehova, si, Jehova gānọ n'etiti mu na gi, na n'etiti nkpurum na nkpuru-gi, rue mb͕e ebighi-ebi. O we bilie, la: Jonatan we ba n'obodo.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

I. SAMUEL 20: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye