Ma umu-ndikom Ilai bu ndi jọb͕uru onwe-ha; ha amaghi Jehova. Ikpe ekpere banyere ndi-nchu-àjà n'ebe ndi Israel nọ bu nka, mb͕e nwoke ọ bula nāchu àjà, nwa-okorọbia nke onye-nchu-àjà we bata, mb͕e anēsi anu, nduri nke wara ezé atọ di n'aka-ya; o we dubà ya n'ite ọku, ma-ọbu n'ite isi miri, ma-ọbu n'ite isi anu, ma-ọbu n'ite ọzọ; ihe ọ bula ndudu ahu dulitere ka onye-nchu-àjà nēwere na ya. Otú a ka ha nēme Israel nile n'ime Shailo, bú ndi nābia n'ebe ahu. Ọzọ, tutu ha esure abuba ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, nwa-okorọbia nke onye-nchu-àjà biara, si nwoke ahu nke nāchu àjà, Nye anu iruru onye-nchu-àjà; ọ gaghi-anara kwa anu esiri esi n'aka-gi, kama anu ndu. Ma ọ buru na nwoke ahu asi ya, Ha aghaghi isure abuba ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ dika anēme ta, emesia nara n'onwe-gi dika nkpuru-obi-gi si achọ; ọ gāsi kwa, É-è, kama ub͕u a ka i gēnyem: ma ọ buru na i nyeghm, m'gānara ya n'ike. Nmehie umu-okorọbia ahu we di ukwu ri nne n'iru Jehova: n'ihi na ndikom ahu nēleli-onyinye-inata-iru-ọma nke Jehova. Ma Samuel nēje ozi n'iru Jehova, buru nwata, ewerewo kwa ephod nke ákwà ọcha ke ya dika ihe-ọkiké.
Gụọ I. SAMUEL 2
Geere nke a ntị I. SAMUEL 2
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: I. SAMUEL 2:12-18
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị