Onye Filistia ahu we bia, ọ nābia nēru kwa nso Devid; nwoke ahu nke nēbu ọta-ya nēje kwa n'iru ya. Onye Filistia ahu we legide anya buruburu, hu Devid, we lelìa ya anya: n'ihi na ọ bu nwata, nācha kwa ọbara-ọbara, ma kwa nma ile anya. Onye Filistia ahu we si Devid, Ọ̀ bu nkita ka m'bu, na gi onwe-gi nēwere nkpa-n'aka biakutem? Onye Filistia ahu we were chi-ya nile kọcha Devid. Onye Filistia ahu we si Devid, Biakutem, ka m'were kwa anu-aru-gi nye anu-ufe nke elu-igwe na anumanu nke ọhia. Devid we si onye Filistia ahu, Gi onwe-gi nēwere mma-agha, were kwa ube, were kwa nkpunkpu ube, biakutem: ma mu onwem nēwere aha Jehova nke usu nile nke ndi-agha biakute gi, bú Chineke nke usoro-agha nile nke Israel, Onye i taworo uta.
Gụọ I. SAMUEL 17
Geere nke a ntị I. SAMUEL 17
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: I. SAMUEL 17:41-45
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị