Ma ndi Filistia chikọtara ọmuma-ulo-ikwū-ha ibu agha, ewe chikọta ha na Soko, nke Juda nwe, ha we ma ulo-ikwū-ha n'etiti Soko na Azeka, n'Efes-damim. Sọl na ndikom Israel we chikọta onwe-ha, ma ulo-ikwū-ha na ndagwurugwu Ila, we do agha n'usoro izute ndi Filistia. Ndi Filistia we nēguzo n'ugwu n'otù akuku, Israel nēguzo kwa n'ugwu n'akuku nke-ọzọ: ndagwurugwu we di n'etiti ha. Onye-nputa-ọb͕ọ-agha we si n'ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia puta, aha-ya bu Gọlaiat, sitere na Gat, ogologo-ya di cubit isi na otù ntù-aka. Okpu-agha ọla di kwa n'isi-ya, ọ bu kwa uwe-agha emere dika akpirikpa-azù ka eyikwasiri ya; ọtùtù uwe-agha ahu di nnù shekel ọla iri-na-abua na ọgu iri. Ihe-ọla eji kpuchi ukwu di kwa n'ukwu-ya abua, nkpunkpu ube ọla di kwa n'etiti ubu-ya abua. Osisi ube-ya di kwa ka oké ókpòrò di arọ́ nke ọkpa-ákwà ji akpa ákwà; isi ube-ya di nnù shekel ígwè na ọgu iri: onye nēbu ọta-ya nēje n'iru ya. O we guzo kpọ usoro-agha nile nke Israel òkù, si ha, N'ìhi gini ka unu putaworo ido agha-unu n'usoro? mu onwem, àbughm onye Filistia? ma unu onwe-unu, ùnu abughi ndi-orù Sọl nwe? rọputaranu onwe-unu otù nwoke, ka ọ ridakutekwam. Ọ buru na ọ puru ilusom ọ̀gù, we tib͕uem, ayi gābu-kwa-ra unu ndi-orù: ma ọ buru na mu onwem puru ilub͕u ya, we tib͕ue ya, unu gābu-kwa-ra ayi ndi-orù, we fè ayi òfùfè. Onye Filistia ahu we si, Mu onwem atawo usoro-agha nile nke Israel uta ta; nyenum otù nwoke, ka ayi we lurita ọ̀gù. Sọl na Israel nile we nu okwu nile ndia nke onye Filistia, ha we tua ujọ, tua egwu nke-uku.
Ma Devid bu nwa onye Efrat ahu nke Bet-lehem-juda, nke aha-ya bu Jesi; o nwe-kwa-ra umu-ndikom asatọ: nwoke ahu aghọwo kwa agadi n'etiti ndikom n'ubọchi Sọl. Umu-ndikom atọ nke Jesi ndi bu okenye we je soro Sọl ibu agha: aha umu-ya ndikom atọ ndi jere agha bu Elaiab ọkpara-ya, na Abinadab nke so ya, na Shama, bú nke-atọ. Ma Devid, ya onwe-ya bu ọdudù-nwa: atọ ahu, bú okenye, we jeso Sọl n'azu. Ma Devid nējekuru Sọl, nēsi kwa n'ebe Sọl nọ laghachi, izù ìgwè ewu na aturu nna-ya na Bet-lehem. Onye Filistia ahu nābiaru kwa nso n'isi-ututu na n'anyasi, we guzo onwe-ya ọgu abali abua.
Jesi we si Devid nwa-ya, Biko, wegara umu-nne-gi otù ephah nke ọka nka aṅara n'ọku, na ob͕e achicha iri ndia, būru ha b͕a ọsọ je n'ọmuma-ulo-ikwū jekuru umu-nne-gi; buga-kwa-ra onye-isi usu nnù ndikom na ọgu ise nke ha cheese iri ndia, lekọta kwa umu-nne-gi ma ha nọ n'udo, nara kwa ihe-mbe-ha. Ma Sọl, na ndi ahu, na ndikom nile nke Israel, nọ na ndagwurugwu Ila, nēbuso ndi Filistia agha. Devid we bilie n'isi-ututu, rapu ìgwè ewu na aturu ahu n'aka onye nēdebe aturu, o we būru, je, dika Jesi nyere ya iwu: o we biarue ebe anēdebe ub͕ọ-ala, mb͕e usu-ndi-agha ndi nāpukuru usoro-agha nēti nkpu n'agha. Israel na ndi Filistia we do onwe-ha n'usoro-agha izute usoro-agha. Devid we zitu ihe nile o bu rapu n'aka onye nēdebe ihe, o we b͕abà n'usoro-agha, bia, jua umu-nne-ya ajuju bayere udo-ha. Ma mb͕e ya na ha nēkwu okwu, le, onye-nputa-ọb͕ọ-agha ahu nēsi n'usoro-agha ndi Filistia rigota, bú onye Filistia ahu, Gọlaiat bu aha-ya, sitere na Gat, ọ we kwue dika okwu ndia si di: Devid we nu ha. Ndikom nile nke Israel, mb͕e ha huru nwoke ahu, ha we b͕apu n'iru ya, tua egwu nke-uku. Ndikom Israel we si, Ùnu ahuwo nwoke a nke nārigota? n'ihi na ọ bu ita Israel uta ka ọ nārigota: ọ gēru kwa, na nwoke nke nētib͕u ya, eze gēwere àkù uku me ka ọ buru ọgaranya, ọ gēnye kwa ya nwa-ya nwayi, me ka ulo nna-ya nwere onwe-ya n'Israel. Devid we gwa ndikom ndi ya na ha nēguzo okwu, si, Gini ka agēmere nwoke nke gētib͕u onye Filistia nka, wezuga ihe-ita-uta n'aru Israel? n'ihi na ònye bu onye Filistia nka nke anēbìghi úgwù, na ọ gāta usoro-agha nile nke Chineke di ndu uta? Ndi Israel we gwa ya okwu dika okwu a si di, si, Otú a ka agēmere nwoke nke gētib͕u ya. Elaiab, bú nwa-nne-ya nke-okenye, we nu mb͕e ọ nāgwa ndikom ahu okwu; iwe Elaiab we di ọku megide Devid, ọ si, N'ìhi gini kwa ka i ridataworo? ọ̀ bu kwa n'aka onye ka i rapuru aturu ole-na-ole ahu n'ọzara? mu onwem mara nganga-gi, na ihe ọjọ nke obi-gi; n'ihi na ọ bu ihu agha ka i ridataworo. Devid we si, Gini ka m'meworo ub͕u a? ọ̀ bughi okwu efu, bu ihe a m'nēkwu? O we si n'akuku ya chigharia, che onye ọzọ iru, kwue dika okwu a si di: ndi Israel we zaghachi ya okwu dika okwu mbu si di. Ewe nu okwu nke Devid kwuru, ha we gosi ha n'iru Sọl, o we nara ya. Devid we si Sọl, Ka obi madu ọ bula ghara ifepu n'ihi ya; orù-gi gēje luso onye Filistia nka ọ̀gù. Sọl we si Devid, I pughi ijekuru onye Filistia nka iluso ya ọ̀gù: n'ihi na nwata ka i bu, ma ya onwe-ya bu nwoke agha site na mb͕e ọ di na nwata. Devid we si Sọl, Onye nāzùru nna-ya ìgwè ewu na aturu ka orù-gi buworo; ọdum we bia, ya na bear, we būpu nwa-aturu n'ìgwè aturu, m'we pua so ya n'azu, tib͕ue ya, naputa nwa-aturu ahu n'ọnu-ya: o we bilie imegidem, m'we jide ya n'ọza-ya, tib͕ue ya, me ka ọ nwua. Orù-gi tib͕uru ma ọdum ahu ma bear ahu: onye Filistia nka anēbìghi úgwù gādi kwa ka otù nime ha, n'ihi na ọ bu usoro-agha nile nke Chineke di ndu ka ọ taworo uta. Devid we si, Jehova nke naputaram n'aka ọdum, na n'aka bear, Ya onwe-ya gānaputam n'aka onye Filistia nka. Sọl we si Devid, Je, Jehova gānọye-kwa-ra gi.