Ma otù nwoke nke Ramataim-zofim, nke ugwu Efraim, di, aha-ya bu Elkena, nwa Jeroham, nwa Elaihu, nwa Tohu, nwa Zuf, onye Efrata: o nwekwara ndinyom abua; aha otù bu Hana, aha nke ibe-ya bu Penina: Penina nwere umu, ma Hana enweghi umu. Nwoke a we si n'obodo-ya nārigo kwa-arọ ikpọ isi ala na ichuru Jehova nke usu nile nke ndi-agha àjà n'ime Shailo. Ọ bu kwa n'ebe ahu ka umu-ndikom Ilai abua, bú Họfnai na Finehas, ndi-nchu-àjà Jehova, nọ. Ubọchi ahu wee rue, Elkena we chua àjà, nye Penina nwunye-ya òkè ufọdu, nye kwa umu-ya ndikom na umu-ya ndinyom nile: ma o nyere Hana òkè madu abua: n'ihi na ọ bu Hana ka ọ huru n'anya, ma Jehova mechiri àkpà-nwa-ya. Onye-nkpab͕u-ya we kpasue ya iwe nke-uku, imekpa ya aru, n'ihi na Jehova mechiri àkpà-nwa-ya. Ọ bu kwa otú a ka Elkena nēme kwa-arọ, mb͕e ọ bula Hana rigoro n'ulo Jehova, otú a ka Penina nākpasu ya iwe; o we kwa ákwá, ghara iri ihe.
Gụọ I. SAMUEL 1
Geere nke a ntị I. SAMUEL 1
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: I. SAMUEL 1:1-7
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị