O rue, mb͕e Solomon kpebìri ekpere a nile na aririọ-amara a nile nye Jehova, na o siri n'iru ebe-ichu-àjà Jehova bilie, site n'ib͕u ikperè-ya abua n'ala, site kwa n'ime ka aka-ya abua b͕asa n'ebe elu-igwe di. O we guzo, were oké olu gọzie nkpọkọta nile nke Israel, si, Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, Onye nyeworo ndi-Ya, bú Israel, izu-ike, dika ihe nile nke O kwuru si di: ọ dighi otù okwu dapuru n'okwu-Ya nile di nma, nke O kwuru n'aka Moses, bú orù-Ya. Ka Jehova, bú Chineke-ayi, nọyere ayi, dika Ọ nọyere nna-ayi-hà: ka Ọ ghara irapu ayi, ka Ọ ghara kwa ib͕anari ayi: ka O we wezuga obi-ayi ka ha biakute Ya, ije ije n'uzọ-Ya nile, na idebe ihe nile O nyere n'iwu, na ukpuru-Ya nile, na ikpé-Ya nile, nke O nyere nna-ayi-hà n'iwu. Ka okwum ndia, nke m'jiri riọ amara n'iru Jehova, di kwa nso Jehova, bú Chineke-ayi, ehihie na abali, ka O we mezie ikpé orù-Ya, na ikpé ndi-Ya, bú Israel, ihe ubọchi n'ubọchi-ya: ka ndi nile nke uwa we mara na Jehova, Ya onwe-ya bu Chineke; onye ọzọ adighi. Ka obi-unu zu kwa okè n'ebe Jehova, bú Chineke-ayi, nọ, ijeghari n'ukpuru-Ya nile, na idebe ihe nile O nyere n'iwu, otú ọ di ta. Eze, ya na Israel nile, nāchu kwa àjà n'iru Jehova. Solomon we chua ihe àjà nke àjà-udo nke ọ churu nye Jehova, bú orú nnù ehi uzọ abua na nnù iri-na-ise, na orú nnù aturu uzọ iri-na-ise. Eze na umu Israel nile we ra ulo Jehova nye Chineke. N'ubọchi ahu ka eze doro etiti ogige nke di n'iru ulo Jehova nsọ; n'ihi na ọ churu àjà-nsure-ọku na onyinye-inata-iru-ọma na abuba àjà-udo n'ebe ahu: n'ihi na ebe-ichu-àjà ọla nke di n'iru Jehova di ntà kari inagide àjà-nsure-ọku, na onyinye-inata-iru-ọma, na abuba àjà-udo. Solomon we me ememe na mb͕e ahu, ya na Israel nile, nkpọkọta uku, site na nbata Hemat rue miri-iyi Ijipt, n'iru Jehova, bú Chineke-ayi, ubọchi asa na ubọchi asa, bú ubọchi iri na anọ. N'ubọchi nke-asatọ o zilagara ndi Israel, ha we gọzie eze, la n'ulo-ikwū-ha nāṅuri ọṅu, obi di kwa ha nma, n'ihi ezi ihe nile nke Jehova mere Devid, bú orù-Ya, nke O me-kwa-ra Israel, bú ndi-Ya.