Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. NDI-EZE 6

6
1O rue, n'arọ nke-nnù-na-ọgu-anọ site na mb͕e umu Israel siri n'ala Ijipt putasia, n'arọ nke-anọ nke Solomon bu eze Israel, n'ọnwa Ziv, nke bu ọnwa nke-abua, na o wubere Jehova ulo. 2Ma ulo ahu nke eze, bú Solomon, wuru Jehova, ọgu cubit atọ ka ogologo-ya di, orú cubit ka obosara-ya di, orú cubit na iri ka idi-elu-ya di. 3Uzọ-nbata kwa nke di n'iru ulo uku nke ulo ahu, orú cubit ka ogologo-ya di, n'iru obosara ulo ahu; cubit iri ka obosara-ya di n'iru ulo ahu. 4O we mere ulo ahu window ufọdu di obosara nime, kpa kwa nkpa n'èzi. 5O wu-kwa-ra okpukpu-ulo n'akuku mb͕idi ulo ahu buruburu, bú mb͕idi nile nke ulo ahu buruburu, ma nke ulo uku Chineke ahu, ma nke ime-ime-ulo ahu: o me-kwa-ra ulo ntà nke akuku buruburu: 6Okpukpu-ulo nke dikarisiri ala, cubit ise ka obosara-ya di, okpukpu-ulo nke-etiti kwa, cubit isi ka obosara-ya di, okpukpu-ulo nke-atọ kwa, cubit asa ka obosara-ya di: n'ihi na o tiyere ngwe n'ulo ahu buruburu n'èzí, ka ihe we ghara ibà na mb͕idi ulo ahu. 7Ulo ahu, mb͕e anēwu ya, eji nkume nke awazuru awazu mb͕e ebutere ya wue ya: anughi kwa otùtù ma-ọbu anyu-ike ma-ọbu ihe-ọlu ọ bula nke ígwè n'ulo ahu, mb͕e anēwu ya. 8Ọnu-uzọ nke ulo ntà nke akuku nke-etiti di n'akuku aka-nri nke ulo ahu: ha we si n'uzọ-nrigo nke nāga buruburu nārigo n'ulo ntà nke-etiti, si kwa na nke-etiti je rue nke-atọ. 9O we wue ulo ahu, wusia ya; o we were ibo na akuku osisi cedar kpue ulo ahu. 10O wue okpukpu-ulo n'aru ulo ahu nile, cubit ise ka idi-elu-ha di: ha we dabere n'ulo ahu n'osisi cedar.
11Okwu Jehova we biakute Solomon, si, 12Ulo a nke gi onwe-gi nēwu, ọ buru na i jegharia n'ukpurum nile, ọ buru kwa na i me ihe nile M'kpere n'ikpe, ọ buru kwa na i debe ihe nile M'nyere n'iwu ijeghari nime ha; M'gēme kwa ka okwum guzosie ike n'ebe i nọ, bú nke M'gwara Devid, bú nna-gi. 13M'gēbi kwa n'etiti umu Israel, M'gaghi-arapu kwa ndim, bú Israel.
14Solomon we wue ulo ahu, wusia ya. 15O were ibo osisi cedar wue mb͕idi ulo ahu nime; site n'ala ulo rue mb͕idi nke okpukpu, o were osisi machita ha nime: o were ibo osisi fir machita ala ulo. 16O were ibo osisi cedar wue ebe di orú cubit n'azu ulo ahu, site n'ala ulo rue mb͕idi: o were ha wuere ya nime, ibu ime-ime-ulo, ibu ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile. 17Ulo ahu, nke ahu bú, ulo uku Chineke nke di n'iru ya, di ọgu cubit abua n'ogologo. 18Osisi cedar di kwa n'aru ulo ahu nime, nke apiri ihe otutu, bú afufa-ọhia na okoko-osisi wara awa: ime ulo ahu nile bu osisi cedar; ọ dighi nkume ahuru anya. 19O dozi-kwa-ra ime-ime-ulo n'etiti ulo ahu nime, itiye ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova n'ebe ahu. 20Ma n'iru ime-ime-ulo ahu di orú cubit n'ogologo, na orú cubit n'obosara, na orú cubit n'idi-elu-ya; ọ machita ya ọla-edo makarisiri nma: o were kwa osisi cedar machita ebe-ichu-àjà. 21Solomon we were ọla-edo makarisiri nma machita ulo ahu nime: o me ka iyab͕a ọla-edo gabiga n'iru ime-ime-ulo ahu; ọ machita kwa ya ọla-edo. 22Ọ machita-kwa-ra ulo ahu nile ọla-edo, rue mb͕e amachitazuru ulo nile: o were kwa ọla-edo machita ebe-ichu-àjà ahu nile bu nke diri ime-ime-ulo ahu. 23O me-kwa-ra cherubim abua nke osisi manu olive n'ime-ime-ulo ahu, cubit iri ka elu-ha di. 24Cubit ise ka otù nku cherub di, cubit ise ka nkù nke-ọzọ nke cherub di kwa: site na nsọtu nkù-ya we rue nsọtu nke-ọzọ nke nkù-ya di cubit iri. 25Cubit iri ka cherub nke-ọzọ di kwa: cherubim abua ahu nwere otù ọtùtù na otù ọpipi. 26Idi-elu otù cherub di cubit iri, otú a ka cherub nke-ọzọ di kwa. 27O we tiye cherubim n'etiti ime-ulo: ha we b͕asa nkù cherubim ahu, nkù nke otù we metu mb͕idi, nkù cherub nke-ọzọ nēmetu kwa mb͕idi nke-ọzọ; nkù-ha nēmeturita onwe-ha, nkù na nkù, n'etiti ulo ahu. 28Ọ machita cherubim ọla-edo. 29Ọ tu-kwa-ra mb͕idi nile nke ulo ahu buruburu n'eb͕ub͕u nke ihe-ọpipi, bú cherubim na nkwu na okoko-osisi wara awa, n'ime na n'èzí. 30Ọ machita-kwa-ra ala ulo ahu ọla-edo, n'ime na n'èzí. 31O me ibo-uzọ osisi manu olive tiye n'ọnu-uzọ ime-ime-ulo ahu: ọfiere-uzọ na awara-uzọ abua bu otù uzọ n'uzọ ise nke mb͕idi. 32Ibo-uzọ abua ahu bu osisi manu olive; ọ pia n'elu ha ihe-ọpipi, bú cherubim na nkwu na okoko-osisi wara awa, ọ machita ha ọla-edo; o tisa kwa ọla-edo n'aru cherubim, na n'aru nkwu. 33Otú a ka o me-kwa-ra awara-uzọ abua nke osisi manu olive itiye n'ọnu-uzọ ulo uku Chineke, site n'otù uzọ n'uzọ anọ nke mb͕idi; 34na ibo-uzọ abua nke osisi fir; ibewa-uzọ abua nke otù ibo-uzọ nāga buruburu, ibewa-uzọ abua nke ibo-uzọ nke-ọzọ nāga kwa buruburu. 35Ọ pia n'elu ha cherubim na nkwu na okoko-osisi wara awa: ọ were ọla-edo nke emere ka ọ dabà n'elu ihe eb͕uru eb͕ub͕u machita ha. 36O were akuku nkume awara awa atọ na otù ariri osisi cedar awara awa wue ogige ime-ime. 37N'arọ nke-anọ ka atọrọ ntọ-ala ulo Jehova, n'ọnwa Ziv. 38Ma n'arọ nke-iri-na-otù, n'ọnwa Bul, nke bu ọnwa nke-asatọ, ka ewusiri ulo ahu n'ihe-ya nile na n'ikpé-ya nile. O we nọ arọ asa n'iwu ya.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

I. NDI-EZE 6: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye