Jehoshafat nwa Esa malitere ibu eze Juda n'arọ nke-anọ nke Ehab, bú eze Israel. Jehoshafat b͕ara orú arọ na iri na ise mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze orú arọ na ise na Jerusalem. Aha nne-ya bu Azuba nwa-nwayi Shilhi. O jere ije n'uzọ Esa, bú nna-ya; o sighi nime ya wezuga onwe-ya, nēme ihe ziri ezi n'anya Jehova: nání na ewezugaghi ebe di elu; ndi Israel nọ nāchu àjà nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe di elu nile. Jehoshafat me-kwa-ra ka ya na eze Israel di n'udo. Ma okwu Jehoshafat nile nke fọduru, na ihe idi-ike-ya nke o mere, na otú o buru agha, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda? Ọzọ, ndi fọduru n'etiti ndi edoro nsọ ikwa iko, bú ndi fọduru n'ubọchi Esa nna-ya, o kpochapuru ha n'ala. Ma eze adighi n'Edom: onye edoro onye-isi bu eze. Jehoshafat mere ub͕ọ Tashish ijeru Ofia ibute ọla-edo: ma ha ejeghi; n'ihi na etiwara ub͕ọ ahu n'Ezion-geba. Mb͕e ahu Ehazaia nwa Ehab siri Jehoshafat, Ka ndi-orùm soro ndi-orù-gi je n'ub͕ọ-gi. Ma Jehoshafat ekweghi.
Gụọ I. NDI-EZE 22
Geere nke a ntị I. NDI-EZE 22
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: I. NDI-EZE 22:41-49
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo