I. NDI-EZE 21
21
1O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na Nebot, bú onye Jezreel, nwere ubi-vine, nke di na Jezreel, n'akuku ulo uku Ehab, bú eze Sameria. 2Ehab we gwa Nebot okwu, si, Nyem ubi-vine-gi, ka o we burum ubi ab͕ara ogige ebe anāku akwukwọ nri, n'ihi na nke ahu di nso n'akuku ulom; ka m'nye kwa gi ubi-vine di nma kari ya n'ọnọdu ya: ma ọ buru na ọ di nma n'anya-gi, ka m'nye gi ego ruru ọnu-ahia-ya. 3Nebot we si Ehab, Ya burum ihe-árú sitere na Jehova, bú inye gi ihe-nketa nnam-hà. 4Ehab we ba n'ulo-ya n'obi arọ́ na nb͕aru-iru, n'ihi okwu nke Nebot, bú onye Jezreel, gwara ya: n'ihi na ọ siri, M'gaghi-enye gi ihe-nketa nnam-hà. O we dina n'ihe-ndina-ya, chigharia iru-ya, o righi kwa nri. 5Jezebel, bú nwunye-ya, we biakute ya, gwa ya okwu, si, Gini me-kwa-ra mọ-gi di arọ́, i nērighi kwa nri? 6Ọ si ya, N'ihi na agwaram Nebot, bú onye Jezreel, okwu, si ya, Nyem ubi-vine-gi n'ego; ma-ọbu, ọ buru na ọ tọ gi onwe-gi utọ, ka m'nye gi ubi-vine ọzọ n'ọnọdu ya: o we si, M'gaghi-enye gi ubi-vine nkem. 7Jezebel, bú nwunye-ya, si ya, Ọ̀ bughi gi onwe-gi bu eze nāchi Israel ub͕u a? bilie, rie nri, ka obi-gi di nma: mu onwem gēnye gi ubi-vine Nebot, bú onye Jezreel. 8O we de akwukwọ n'aha Ehab, were nb͕a-aka-akàrà-ya ka ha, zigara ndi-okenye akwukwọ ahu, ziga-kwa-ra ndi amara aha-ha ndi nọ n'obodo-ya, ndi ha na Nebot bi. 9O we de n'akwukwọ ahu, si, Kpọsanu obu-bu-ọnu, me ka Nebot nọdu n'isi ọnọdu n'etiti ndi Israel: 10me-kwa-nu ka ndikom abua, bú ndi jọb͕uru onwe-ha, nọdu n'iru ya, ka ha b͕a kwa àmà megide ya, si, I b͕akutere Chineke na eze azu. Me-kwa-nu ka ọ pua, werenu nkume tub͕ue ya, ka ọ nwua. 11Ndikom obodo-ya, bú ndi-okenye na ndi amara aha-ha ndi bi n'obodo-ya, we me dika Jezebel zitere ha ozi, dika edere ya n'akwukwọ nke o zitere ha. 12Ha kpọsara obubu-ọnu, me ka Nebot nọdu n'isi ọnọdu n'etiti ndi Israel. 13Ndikom abua ahu, bú ndi jọb͕uru onwe-ha, we bata, nọdu n'iru ya: ndikom ahu ndi jọb͕uru onwe-ha we b͕a àmà megide ya, bú Nebot, n'iru ndi Israel, si, Nebot b͕akutere Chineke na eze azu. Ha we me ka ọ pua rue azu obodo, ha were nkume tub͕ue ya, o we nwua. 14Ha we zigara Jezebel ozi, si, Atub͕uwo Nebot na nkume, ọ nwuwo kwa. 15O rue, mb͕e Jezebel nuru na atub͕uwo Nebot na nkume, na ọ nwuwo kwa, na Jezebel siri Ehab, Bilie, nweta ubi-vine Nebot, bú onye Jezreel, nke ọ juru inye gi n'ego: n'ihi na Nebot adighi ndu, kama ọ nwuwo. 16O rue, mb͕e Ehab nuru na Nebot anwuwo, na Ehab biliri iridaru ubi-vine Nebot, bú onye Jezreel, inweta ya.
17Okwu Jehova we rue Elaija, bú onye Tisbe, nti, si, 18Bilie, ridata izute Ehab, bú eze Israel, onye bi na Sameria; le, ọ nọ n'ubi-vine Nebot, ebe ọ ridara inweta ya. 19Ma i gāgwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova siri, Ì b͕uwo ọchu, nweta kwa? I gāgwa kwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova siri, N'ebe nkita rachara ọbara Nebot ka nkita gāracha ọbara-gi, ọbuná nke gi onwe-gi. 20Ehab we si Elaija, Ì chọtawom, onye-irom? Ọ si, Achọtawom i: n'ihi na i rewo onwe-gi ime ihe jọrọ njọ n'anya Jehova. 21Le, M'nēme ka ihe ọjọ bakute gi, M'gēkpochapu ndi-gi fọduru, M'gēbipu kwa n'aru Ehab nwa-nwoke ọ bula, na onye eb͕ochiri eb͕ochi na onye arapuru arapu n'Israel, ka Jehova kwuru: 22M'gēme kwa ulo-gi ka ọ di ka ulo Jeroboam nwa Nebat, ka ọ di kwa ka ulo Beasha nwa Ahaija, n'ihi nkpasu-iwe nke i ji kpasum iwe, me kwa ka Israel mehie. 23Ọzọ kwa, Jehova kwuru okwu bayere Jezebel, si, Nkita gēri Jezebel n'ékpè Jezreel. 24Onye nke Ehab nke nwuru anwu n'obodo, nkita gēri ya; onye nke nwuru anwu n'ọhia, anu-ufe nke elu-igwe gēri kwa ya. 25(Otú ọ di, ọ dighi onye di ka Ehab, onye rere onwe-ya ime ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, onye Jezebel, bú nwunye-ya, rafuru. 26Ọ we me ihe-árú nke-uku n'ijeso arusi di iche iche, dika ihe nile si di nke ndi-Amorait mere, ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel.) 27O rue, mb͕e Ehab nuru okwu ndia, na ọ dọwara uwe-ya nile, tukwasi ákwà-nkpe n'anu-aru-ya, bue ọnu, dina n'ákwà-nkpe, jegharia nwayọ. 28Okwu Jehova we rue Elaija, bú onye Tisbe, nti, si,
29Ì huwo na Ehab ewedawo onwe-ya n'ala n'irum? n'ihi na o wedawo onwe-ya n'ala n'irum, M'gaghi-eme ka ihe ọjọ ahu bia n'ubọchi-ya: ọ bu n'ubọchi nwa-ya ka M'gēme ka ihe ọjọ ahu biakwasi ulo-ya.
Nke Ahọpụtara Ugbu A:
I. NDI-EZE 21: IGBOB
Mee ka ọ bụrụ isi
Kesaa
Mapịa
Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.