Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. NDI-EZE 20:1-22

I. NDI-EZE 20:1-22 IGBOB

Ma Ben-hedad, bú eze Siria, chikọtara usu-ndi-agha-ya nile: orú ndi-eze na iri na abua soro kwa ya, ha na inyinya na ub͕ọ-ala: o we rigo, nọchigide Sameria n'agha, buso ya agha. O we zigara Ehab, bú eze Israel, ndi-ozi, rue obodo, si ya, Otú a ka Ben-hedad siri, Ọla-ọcha-gi na ọla-edo-gi, nkem ka ọ bu; ndinyom-i kwa na umu-gi, bú nke di nma kari, nkem ka ha bu. Eze Israel we za, si, Dika okwu-gi si di, Onye-nwem, eze; nke gi ka mu onwem na ihe nile m'nwere bu. Ndi-ozi ahu we biaghachi, si, Otú a ka Ben-hedad kwuru, si, N'ezie eziterem i ozi, si, Ọla-ọcha-gi na ọla-edo-gi na ndinyom-i na umu-gi, mu ka i gēnye ha; ma m'gēzitere gi ndi-orùm dika mb͕e a echi, ha gāchọ kwa n'ulo-gi, na ulo ndi-orù-gi;ọ gēru kwa, na ihe ọ bula anya-gi nāchọsi ike, ha gētiye ya n'aka-ha, were ya. Eze Israel we kpọ ndi-okenye nile nke ala, si, Biko, maranu, hu kwa, na ọ bu ihe ọjọ ka nwoke a nāchọ: n'ihi na o ziterem ozi ichinye ya ndinyom nkem, na ichinye ya umum, na inye ya ọla-ọcham, na inye ya ọla-edom; ma eb͕ochighm ha n'aka-ya. Ndi-okenye nile na ndi Israel nile we si ya, Anula okwu-ya, ekwe-kwa-la. O we si ndi-ozi Ben-hedad, Sinu onye-nwem, bú eze, Ihe nile i buru uzọ zitere orù-gi ozi ime, nke ahu ka m'gēme: ma ihe a, apughm ime ya. Ndi-ozi we la, weghachiri ya okwu. Ben-hedad we zigara ya ozi, si, Ka chi mem otú a, ka ha mekwam ihe ọzọ otú a, asi na ájá Sameria gēzu nju-aka inye ndi nile nọ n'ukwum. Eze Israel we za, si, Kwuenu, si ya, Ka onye nēke ekike-agha-ya ghara ito onwe-ya dika onye nēkepu ya. O rue, mb͕e Ben-hedad nuru okwu a, mb͕e ọ nāṅu ihe-ọṅuṅu, ya onwe-ya na ndi-eze, n'ulo-ntu, na ọ siri ndi-orù-ya, Donu onwe-unu n'usoro. Ha we do onwe-ha n'usoro imegide obodo ahu. Ma, le, otù onye-amuma biaruru Ehab, bú eze Israel, nso, si, Otú a ka Jehova siri, Ì huwo oké ìgwè madu nile a? le, anamenye ya n'aka-gi ta; i gāma kwa na Mu onwem bu Jehova. Ehab we si, Sìte n'aka onye? Ọ si, Otú a ka Jehova siri, Site n'aka umu-okorọbia nke ndi-isi ala anāchi achi. Ọ si, Ònye gāmalite agha ahu? Ọ si, Gi onwe-gi. O we gukọta umu-okorọbia nke ndi-isi ala anāchi achi, ha we di ọgu iri-na-otù na iri na abua: mb͕e agukọtasiri ha ọ gukọta ndi-ya nile, bú umu Israel nile, nnù iri-na-asa na ọgu iri. Ha we pua n'etiti-ehihie. Ma Ben-hedad nāṅu manya nāṅubiga ya okè n'ulo-ntu-ya, ya onwe-ya na ndi-eze, bú orú ndi-eze na iri na abua ahu ndi nēyere ya aka. Umu-okorọbia nke ndi-isi ala anāchi achi we buru uzọ pua; Ben-hedad we zipu, ha we gosi ya, si, Ndikom esiwo na Sameria puta. Ọ si, Ọ buru na ọ bu okwu udo ka ha putaworo, jidenu ha na ndu: ọ buru kwa na ọ bu ibu agha ka ha putaworo, jidenu ha na ndu. Ma ndia siri n'obodo pua, bú umu-okorọbia nke ndi-isi ala anāchi achi, na usu-ndi-agha ndi soro ha n'azu. Ha we tib͕ue, nwoke ọ bula nwoke-ibe-ya; ndi Siria we b͕alaga, Israel we chua ha n'azu: Ben-hedad, bú eze Siria, we wepuga onwe-ya n'elu inyinya, ya na ndi-inyinya. Eze Israel we pua, tib͕ue inyinya na ub͕ọ-ala, o tib͕u-kwa-ra ntib͕u uku n'etiti ndi Siria. Onye-amuma ahu we biarue eze Israel nso, si ya, Je ime onwe-gi ka i di ike, mara, hu kwa ihe i nēme: n'ihi na n'ọb͕ub͕a arọ ka eze Siria ganārigota imegide gi.