Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. NDI-EZE 20

20
1Ma Ben-hedad, bú eze Siria, chikọtara usu-ndi-agha-ya nile: orú ndi-eze na iri na abua soro kwa ya, ha na inyinya na ub͕ọ-ala: o we rigo, nọchigide Sameria n'agha, buso ya agha. 2O we zigara Ehab, bú eze Israel, ndi-ozi, rue obodo, si ya, 3Otú a ka Ben-hedad siri, Ọla-ọcha-gi na ọla-edo-gi, nkem ka ọ bu; ndinyom-i kwa na umu-gi, bú nke di nma kari, nkem ka ha bu. 4Eze Israel we za, si, Dika okwu-gi si di, Onye-nwem, eze; nke gi ka mu onwem na ihe nile m'nwere bu. 5Ndi-ozi ahu we biaghachi, si, Otú a ka Ben-hedad kwuru, si, N'ezie eziterem i ozi, si, Ọla-ọcha-gi na ọla-edo-gi na ndinyom-i na umu-gi, mu ka i gēnye ha; 6ma m'gēzitere gi ndi-orùm dika mb͕e a echi, ha gāchọ kwa n'ulo-gi, na ulo ndi-orù-gi;ọ gēru kwa, na ihe ọ bula anya-gi nāchọsi ike, ha gētiye ya n'aka-ha, were ya. 7Eze Israel we kpọ ndi-okenye nile nke ala, si, Biko, maranu, hu kwa, na ọ bu ihe ọjọ ka nwoke a nāchọ: n'ihi na o ziterem ozi ichinye ya ndinyom nkem, na ichinye ya umum, na inye ya ọla-ọcham, na inye ya ọla-edom; ma eb͕ochighm ha n'aka-ya. 8Ndi-okenye nile na ndi Israel nile we si ya, Anula okwu-ya, ekwe-kwa-la. 9O we si ndi-ozi Ben-hedad, Sinu onye-nwem, bú eze, Ihe nile i buru uzọ zitere orù-gi ozi ime, nke ahu ka m'gēme: ma ihe a, apughm ime ya. Ndi-ozi we la, weghachiri ya okwu. 10Ben-hedad we zigara ya ozi, si, Ka chi mem otú a, ka ha mekwam ihe ọzọ otú a, asi na ájá Sameria gēzu nju-aka inye ndi nile nọ n'ukwum. 11Eze Israel we za, si, Kwuenu, si ya, Ka onye nēke ekike-agha-ya ghara ito onwe-ya dika onye nēkepu ya. 12O rue, mb͕e Ben-hedad nuru okwu a, mb͕e ọ nāṅu ihe-ọṅuṅu, ya onwe-ya na ndi-eze, n'ulo-ntu, na ọ siri ndi-orù-ya, Donu onwe-unu n'usoro. Ha we do onwe-ha n'usoro imegide obodo ahu. 13Ma, le, otù onye-amuma biaruru Ehab, bú eze Israel, nso, si, Otú a ka Jehova siri, Ì huwo oké ìgwè madu nile a? le, anamenye ya n'aka-gi ta; i gāma kwa na Mu onwem bu Jehova. 14Ehab we si, Sìte n'aka onye? Ọ si, Otú a ka Jehova siri, Site n'aka umu-okorọbia nke ndi-isi ala anāchi achi. Ọ si, Ònye gāmalite agha ahu? Ọ si, Gi onwe-gi. 15O we gukọta umu-okorọbia nke ndi-isi ala anāchi achi, ha we di ọgu iri-na-otù na iri na abua: mb͕e agukọtasiri ha ọ gukọta ndi-ya nile, bú umu Israel nile, nnù iri-na-asa na ọgu iri. 16Ha we pua n'etiti-ehihie. Ma Ben-hedad nāṅu manya nāṅubiga ya okè n'ulo-ntu-ya, ya onwe-ya na ndi-eze, bú orú ndi-eze na iri na abua ahu ndi nēyere ya aka. 17Umu-okorọbia nke ndi-isi ala anāchi achi we buru uzọ pua; Ben-hedad we zipu, ha we gosi ya, si, Ndikom esiwo na Sameria puta. 18Ọ si, Ọ buru na ọ bu okwu udo ka ha putaworo, jidenu ha na ndu: ọ buru kwa na ọ bu ibu agha ka ha putaworo, jidenu ha na ndu. 19Ma ndia siri n'obodo pua, bú umu-okorọbia nke ndi-isi ala anāchi achi, na usu-ndi-agha ndi soro ha n'azu. 20Ha we tib͕ue, nwoke ọ bula nwoke-ibe-ya; ndi Siria we b͕alaga, Israel we chua ha n'azu: Ben-hedad, bú eze Siria, we wepuga onwe-ya n'elu inyinya, ya na ndi-inyinya. 21Eze Israel we pua, tib͕ue inyinya na ub͕ọ-ala, o tib͕u-kwa-ra ntib͕u uku n'etiti ndi Siria. 22Onye-amuma ahu we biarue eze Israel nso, si ya, Je ime onwe-gi ka i di ike, mara, hu kwa ihe i nēme: n'ihi na n'ọb͕ub͕a arọ ka eze Siria ganārigota imegide gi.
23Ma ndi-orù eze Siria siri ya, Chi ukwu ka chi-ha bu; n'ihi ya ka ha di ike kari ayi: ma otú ọ di, ka ayi buso ha agha n'ala di lari, ayi aghaghi kwa idi ike kari ha. 24Ma me ihe a; wezuga ndi-eze, nwoke ọ bula n'ebe-ya, do ndi nāchi ala n'ọnọdu ha: 25ma gi onwe-gi, gutara onwe-gi usu-ndi-agha, dika usu-ndi-agha nke dapunariworo gi n'agha, inyinya n'ọnọdu inyinya, na ub͕ọ-ala n'ọnọdu ub͕ọ-ala: ayi gēbuso kwa ha agha n'ala di lari, ayi aghaghi kwa idi ike kari ha. O we ge nti olu-ha, me otú a. 26O rue, n'ọb͕ub͕a arọ, na Ben-hedad gukọtara ndi Siria, rigorue Efek, ibuso Israel agha. 27Agukọta-kwa-ra umu Israel, nye ha ihe-oriri, ha we je izute ha: umu Israel we ma ulo-ikwū-ha n'iru ha dika ìgwè ewu ntà abua; ma ndi Siria juputara ala. 28Onye nke Chineke we biarue nso, gwa eze Israel okwu, si, Otú a ka Jehova siri, N'ihi na Siria asiwo, Chi ugwu ka Jehova bu, ma Ọ bughi chi ndagwurugwu; n'ihi ya ka M'gēnye ìgwè uku a nile n'aka-gi, unu gāma kwa na Mu onwem bu Jehova. 29Ha we nọ n'ọmuma-ulo-ikwū, ndi Israel na ncherita-iru ndi Siria, ubọchi asa. O rue, n'ubọchi nke-asa, na agha biaruru nso; umu Israel we tib͕ue Siria, orú nnù ndikom uzọ iri-na-abua na nnù iri, bú ndi ji ukwu eje, n'otù ubọchi. 30Ndi fọduru we b͕alaga n'Efek, rue obodo; mb͕idi obodo we dakwasi orú nnù ndikom atọ na nnù asa na ọgu iri fọduru. Ma Ben-hedad b͕alagara, ba n'obodo, n'ime-ulo nke di n'ime-ulo. 31Ndi-orù-ya we si ya, Biko, le, ayi anuwo na ndi-eze ulo Israel, na eze ebere ka ha bu: biko, ka ayi ke ákwà-nkpe n'úkwù-ayi, na udọ̀ n'isi-ayi, pukuru eze Israel: eleghi anya ọ gēdebe gi ndu. 32Ha we ke ákwà-nkpe n'úkwù-ha, na udọ̀ n'isi-ha, biakute eze Israel, si, Orù-gi, bú Ben-hedad, siri, Biko, ka mu onwem di ndu. Ọ si, Ọ̀ nọ ndu ub͕u a? nwa-nnem ka ọ bu. 33Ma ndikom ahu nāriba ama, ha we me ngwa imata ma ọ bu ihe si n'obi-ya puta; ha we si, Nwa-nne-gi, bú Ben-hedad. Ọ si, Banu n'obodo, kuta ya. Ben-hedad we pukute ya; o me ya ka ọ rigota n'ub͕ọ-ala-ya. 34Ben-hedad we si ya, Obodo nile nke nnam nara n'aka nna-gi, m'gēnyeghachi gi ha; i gākwa-kwa-ra onwe-gi amá nime Damaskọs, dika nnam kwara nime Sameria. Ma mu onwem, ka Ehab kwuru, n'ọb͕ub͕a-ndu nka ka m'gēzilaga gi. Ya na ya we b͕a ndu, o we zilaga ya.
35Ma otù nwoke n'etiti umu ndi-amuma siri ibe-ya n'okwu Jehova, Biko, tiem ihe. Ma nwoke ahu juru iti ya ihe. 36O we si ya, N'ihi na i geghi nti olu Jehova, le, mb͕e i nēsi n'ebe m'nọ la, ọdum gēb͕u gi. O si n'akuku ya la, ọdum we chọta ya. b͕ue ya. 37O we chọta nwoke ọzọ, si, Biko, tiem ihe. Nwoke ahu we tie ya ihe, nēti ya nēb͕u kwa ya mma. 38Onye-amuma ahu we je, guzoro eze n'uzọ, nwogharia onwe-ya, nātukwasi ákwà-ike-n'isi n'anya-ya abua. 39O rue, mb͕e eze nāgabiga, na onye ahu tikuru eze nkpu: ọ si, Orù-gi puru ba n'etiti agha; ma, le, otù nwoke wezugara onwe-ya, me ka otù nwoke biakutem, ọ si, Debe nwoke a: ọ buru na ele anya ya ma-ọli ma ahughi ya, ndu-gi gāla-kwa-ra ndu-ya, ma-ọbu na i gākwu talent ọla-ọcha. 40O rue, mb͕e orù-gi nēme ihe n'otù ebe na ebe ọzọ, na ahughm onye ahu. Eze Israel we si ya, Otú a ka ikpé-gi si di; gi onwe-gi ekwubìwo ya. 41O we me ngwa, wezuga ákwà-ike-n'isi n'anya-ya abua; eze Israel we mata ya na onye sitere na ndi-amuma ka ọ bu. 42Ọ si ya, Otú a ka Jehova siri, N'ihi na i zilagawo nwoke ahu ka ọ pua n'aka-gi, bú onye M'wezugara ka ebibie ya, ndu-gi gāla-kwa-ra ndu-ya, ndi-gi gāla-kwa-ra ndi-ya. 43Eze Israel we la n'ulo-ya n'obi arọ́ na nb͕aru-iru, o we ba na Sameria.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

I. NDI-EZE 20: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye