Jehova we si ya, Je, laghachi n'uzọ-gi rue ọzara Damaskọs: ma mb͕e i biara, i gēte Hazael manu ibu eze Siria: i gēte kwa Jihu, bú nwa Nimshi, manu ibu eze Israel: i gēte kwa Elaisha, bú nwa Shefat, nke Ebel-mehola, ibu onye-amuma n'ọnọdu gi. Ọ gēru kwa, na onye nēwepuga onwe-ya na mma-agha Hazael, Jihu gēme ka ọ nwua: onye nēwepuga kwa onwe-ya na mma-agha Jihu, Elaisha gēme ka ọ nwua. Ma M'gēme ka nnù madu iri-na-asa na ọgu iri fọdu n'Israel, bú ikperè nile nke anēb͕ughi nye Beal, na ọnu ọ bula nke nēsutughi ya. O si n'ebe ahu je, chọta Elaisha nwa Shefat, ma onye ahu nēme ka ehi-ya dọghari ihe eji gwu ala ubi, orú ehi na anọ ejikọrọ abua abua di n'iru ya, ya onwe-ya nọye-kwa-ra ehi abua nke-iri-na-abua: Elaija we gabiga jekuru ya, wusara ya uwe-nwuda-ya. O we rapu ìgwè ehi-ya, b͕aso Elaija n'azu, si, Biko, ka m'sutu nnam na nnem ọnu, m'gējeso kwa gi. Ọ si ya, Laghachi; n'ihi na ọ̀ bu gini ka m'meworo gi? O we si n'iso ya laghachi, were ehi abua ahu ejikọrọ n'otù, b͕ue ha, o were kwa ihe ehi ahu ji alu ọlu sie anu-ha, o nye ndi ahu, ha rie. O bilie, jeso Elaija, we jere ya ozi.