Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. NDI-EZE 17:2-16

I. NDI-EZE 17:2-16 IGBOB

Okwu Jehova we rue ya nti, si, Si n'ebe a pua, chere onwe-gi iru n'Iru-anyanwu, zo onwe-gi na miri-iyi Kerit, nke di n'iru Jọdan. O gēru kwa, na i gāṅu miri sitere na miri-iyi ahu; ọ bu kwa ugolo-ọma ka M'nyeworo iwu izù gi n'ebe ahu. O we je, me dika okwu Jehova si di: o je biri na miri-iyi Kerit, nke di n'iru Jọdan. Ugolo-ọma we nēbutere ya achicha na anu n'ututu, na achicha na anu n'anyasi; ọ nāṅu kwa miri sitere na miri-iyi ahu. O rue, mb͕e ubọchi ufọdu gasiri, na miri-iyi ahu takọrọ, n'ihi na miri-ozuzo adighi n'ala. Okwu Jehova we rue ya nti, si, Bilie, je Zarefat, nke diri Zaidon, biri n'ebe ahu: le, enyewom otù nwayi di-ya nwuru nọ n'ebe ahu iwu izù gi. O we bilie, je Zarefat, biarue ọnu-uzọ-ama obodo ahu, ma, le, n'ebe ahu ka nwayi di-ya nwuru nọ nāchikọta nkú: o we kpọ ya òkù, si, Biko, kuterem nwantī miri n'ihe, ka m'we ṅua. O we je ikute ya, Elaija we kpọ ya òkù, si, Biko, wetaram iberibe achicha n'aka-gi. Nwayi ahu we si, Jehova, bú Chineke-gi, nādi ndu, Ọ dighi ob͕e achicha m'nwere ma-ọli, ma nání otù nju-aka utu ọka n'okpokoro, na nwantī manu n'ite: ma, le, anamachikọta nkú abua, ka m'we ba, were ya doziere onwem, dozi-kwa-ra nwam nwoke, ka ayi we rie ya, nwua. Elaija we si ya, Atula egwu; ba, mere dika okwu-gi si di: nání buru uzọ merem ob͕e achicha ntà site na ya, weputaram ya, ma mere onwe-gi, me-kwa-ra nwa-gi nwoke, n'ikpe-azu. N'ihi na otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Okpokoro utu ọka ahu agaghi-agwu, ite manu ahu agaghi-akọ gi kwa, rue ubọchi Jehova gēnye miri-ozuzo n'elu uwa. O we je me dika okwu Elaija si di: nwayi ahu we rie, ya onwe-ya, na Elaija, na ulo-ya, ọtutu ubọchi. Okpokoro utu ọka ahu agwughi, ite manu ahu akọghi kwa, dika okwu Jehova si di, nke O kwuru n'aka Elaija.