Ma n'arọ nke-orú nke Jeroboam eze Israel ka Esa malitere ibu eze Juda. Ọgu arọ abua na otù ka ọ bu eze na Jerusalem: aha nne-ya bu Meaka nwa-nwayi Abishalom. Esa mere ihe ziri ezi n'anya Jehova, dika Devid, bú nna-ya, mere. O we me ka ndi edoro nsọ ikwa iko si n'ala-ya gabiga, o wezuga-kwa-ra arusi nile nke nna-ya-hà mere. Ọzọ kwa, Meaka, bú nne-ya, o wezuga-kwa-ra ya n'ibu eze-nwayi, n'ihi na o mere ihe kpatara ima-jijiji nye Ashera; Esa we b͕utue ihe-ya kpatara ima-jijiji, o sure ya ọku na miri-iyi Kidron. Ma ewezugaghi ebe di elu: otú ọ di, obi Esa zuru okè n'ebe Jehova nọ ubọchi-ya nile. Ọ chibata n'ulo Jehova ihe nile nna-ya doro nsọ, na ihe nile ya onwe-ya doro nsọ, bú ọla-ọcha, na ọla-edo, na ihe di iche iche ọzọ.
Gụọ I. NDI-EZE 15
Geere nke a ntị I. NDI-EZE 15
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: I. NDI-EZE 15:9-15
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị