Ma Nedab, bú nwa Jeroboam, malitere ibu eze Israel n'arọ nke-abua nke Esa, bú eze Juda, ọ we buru eze Israel arọ abua. O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, je ije n'uzọ nna-ya, na nime nmehie-ya nke o ji me ka Israel mehie. Beasha, bú nwa Ahaija, nke ulo Isaka, we kekọta madu imegide ya; Beasha we tib͕ue ya na Gibeton, nke diri ndi Filistia; n'ihi na Nedab na Israel nile nānọchigide Gibeton n'agha. Beasha we me ka ọ nwua n'arọ nke-atọ nke Esa, bú eze Juda, o we buru eze n'ọnọdu ya. O rue, mb͕e ọ malitere ibu eze, na o tib͕uru ulo Jeroboam nile; o kweghi ka onye ọ bula nke nēku ume fọduru Jeroboam, rue mb͕e o kpochapuru ya; dika okwu Jehova si di, nke O kwuru n'aka orù-Ya, bú Ahaija onye Shailo: n'ihi nmehie nile nke Jeroboam nke o mehiere, na nke o ji me ka Israel mehie; nime nkpasu-iwe-ya nke o ji kpasu Jehova, bú Chineke Israel, iwe. Ma okwu Nedab nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel? Ma agha di n'etiti Esa na Beasha, bú eze Israel, ubọchi-ha nile.
N'arọ nke-atọ nke Esa, bú eze Juda, ka Beasha, bú nwa Ahaija, malitere ibu eze Israel nile nime Tiaza, orú arọ na anọ. O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, je ije n'uzọ Jeroboam, na nime nmehie-ya nke o ji me ka Israel mehie.